Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 25:7 - Bible Nso

7 Ma egeghm nti, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka unu we were ọlu aka-unu kpasuem iwe, ime onwe-unu ihe ọjọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 “Ma unu jụrụ ige m ntị,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Unu ejirila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, si otu a wetara onwe unu mmerụ ahụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 25:7
15 Iomraidhean Croise  

Ha me-kwa-ra ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gabiga nime ọku, ha nāju kwa ase, nāb͕a afa, re onwe-ha ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe.


n'ihi na ha emewo ihe jọrọ njọ n'anyam, ha nākpasukwam ìwe, site n'ubọchi ndi bu nna-ha siri n'Ijipt puta, we rue ta.


O zite ndi-amuma n'etiti ha, ime ka ha laghachikute Jehova; ha we b͕a àmà megide ha: ma ha aṅaghi nti.


Ma ha juru Gi aju, nupu isi megide Gi, tufue iwu-Gi n'azu ha, b͕ue ndi-amuma-Gi ndi b͕ara àmà megide ha ime ka ha chigharikute Gi, ha we me oké ihe-nlelì.


Ma onye nēmehie megidem nēme nkpuru-obi-ya ihe-ike: Ndi nile nke nākpọm asì nāhu ọnwu n'anya.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ a nile biakwasi obodo a, biakwasi kwa obodo-ya nile, bú nke M'kwuworo megide ya; n'ihi na ha ekwesiwo olu-ha ike, ka ha ghara inu okwum nile.


Agwaram i okwu n'udo-gi; ma i siri, M'gaghi-anu. Nka bu uzọ-gi site na mb͕e i di na nwata, na i geghi nti olum.


N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a: N'ihi na unu anughi okwum nile,


n'ihi na ha egeghi nti okwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke M'zigara ha ndi-orùm, bú ndi-amuma, igwa ha, nēbili n'isi-ututu nēziga ha; ma unu egeghi nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma ub͕u a otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N'ìhi gini ka unu onwe-unu nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi unu, ibipu n'ulo-unu nwoke na nwanyi na nwatakiri na nwa nāṅu ara, ka ha pua n'etiti Juda, ewe me ka ọ ghara idi ndi fọduru gāfọduru unu;


n'iji ọlu nile nke aka-unu kpasuem iwe, n'isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ala Ijipt, ebe unu onwe-unu biaworo inọ dika ọbìa; ka ewe bipu unu, ka unu we ghọ kwa ihe-nkọcha na ihe-ita-uta n'etiti mba nile nke uwa?


Unu adila ka nna-unu-hà, ndi ndi-amuma mbu kpọrọ òkù, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Biko, sinu n'uzọ ọjọ nile unu, na n'omume ọjọ nile unu, lata: ma ha anughi, ha aṅaghkwam nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ha onwe-ha ewerewo ihe nābughi Chineke mem ka M'kwo ekworo; Ha ewerewo ihe-efu nile ha kpasuem iwe: Mu onwem gēwere kwa ndi nābughi ndi me ha ka kwo ekworo; Mba nzuzu ka M'gēwere kpasue ha iwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan