Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 25:4 - Bible Nso

4 Jehova ezitewo-kwa-ra unu ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha; ma unu anughi, unu atọghi kwa nti-unu n'ala inu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ọ bụkwa ezie na Onyenwe anyị eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 25:4
24 Iomraidhean Croise  

O zite ndi-amuma n'etiti ha, ime ka ha laghachikute Jehova; ha we b͕a àmà megide ha: ma ha aṅaghi nti.


Jehova we gwa Manase okwu, gwa kwa ndi-ya: ma ha aṅaghi nti.


unu onwe-unu emewo kwa ihe ọjọ kari nna-unu-hà; n'ihi na, le, unu nējeso, onye ọ bula isi-ike nke obi ọjọ ya unu we ghara igem nti:


ma ha anughi, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we kwesie olu-ha ike, ka ha we ghara inu, ghara kwa inara idọ-aka-na-nti.


Ma ha siri, Ntukwasi-obi adigh: n'ihi na èchìchè nile nke ayi ka ayi nējeso, ayi nēme kwa, onye ọ bula ihe isi-ike nke obi ọjọ ya.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ a nile biakwasi obodo a, biakwasi kwa obodo-ya nile, bú nke M'kwuworo megide ya; n'ihi na ha ekwesiwo olu-ha ike, ka ha ghara inu okwum nile.


Agwaram i okwu n'udo-gi; ma i siri, M'gaghi-anu. Nka bu uzọ-gi site na mb͕e i di na nwata, na i geghi nti olum.


Site n'arọ nke-iri-na-atọ nke Josaia nwa Emon, bú eze Juda, we rue ta, orú arọ na ato ndia, ka okwu Jehova ruworom nti, m'we gwa unu, nēbili n'isi-ututu nēkwu; ma unu anughi.


Ma egeghm nti, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka unu we were ọlu aka-unu kpasuem iwe, ime onwe-unu ihe ọjọ.


ige nti okwu nile nke ndi-orùm, bú ndi-amuma, ndi Mu onwem nēzitere unu, nēbili kwa n'isi-ututu nēzite ha, ma unu egeghi nti;


n'ihi na ha egeghi nti okwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke M'zigara ha ndi-orùm, bú ndi-amuma, igwa ha, nēbili n'isi-ututu nēziga ha; ma unu egeghi nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ha we b͕akutam azu, ha echeghm iru: anameme kwa ka ha muta ihe, nēbili n'isi-ututu nēme ka ha muta, ma ha adighi-anu inara idọ́-aka-na-nti.


M'gēji kwa ajọ omume-ha leta ya, leta kwa nkpuru-ya, leta kwa ndi-orù-ya; M'gēme kwa ka ihe ọjọ ahu nile nke M'gwara ha, ma ha anughi, biakwasi ha, biakwasi kwa ndi bi na Jerusalem, biakwasi kwa ndi Juda.


Eme-kwa-ram ka ndi-nche biliere unu, si, Ṅanu nti olu opì-ike; ha we si, Ayi agaghi-aṅa nti.


Unu adila ka nna-unu-hà, ndi ndi-amuma mbu kpọrọ òkù, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Biko, sinu n'uzọ ọjọ nile unu, na n'omume ọjọ nile unu, lata: ma ha anughi, ha aṅaghkwam nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Lezienu anya ka unu ghara iju Onye ahu nēkwu okwu. N'ihi na asi na ndi ahu ab͕anarighi Ya, mb͕e ha juru Onye ahu Nke nādu ha ọdú n'elu uwa, ayi onwe-ayi agaghi-ab͕anari Ya kari nke-uku, bú ndi nāb͕akuta Onye ahu azu Nke nādu ọdú site n'elu-igwe:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan