Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 25:33 - Bible Nso

33 Ndi Jehova b͕uru gādizu kwa n'ubọchi ahu site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu ọzọ nke uwa: agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-achikọta kwa ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Nʼoge ahụ, ndị ahụ Onyenwe anyị ga-egbu ga-atọgbọrọ nʼebe niile, site nʼotu nsọtụ nke ụwa ruo na nke ọzọ. A gaghị eli ha, o nwekwaghị onye ga-akwa ha. Kama ha ga-atọgbọrọ nʼala dịka unyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 25:33
19 Iomraidhean Croise  

ozu Jezebel gādi kwa ka ǹsí-anu n'elu ubi n'òkè-ala-ubi Jezreel; ha ewe ghara isi, Nka bu Jezebel.


Ha awusiwo ọbara-ha dika miri buruburu Jerusalem; Ọ dighi kwa onye ọ bula ṅēli ozu-ha.


Ekpochapuru ha n'En-doa; Ha ghọro ǹsí eji mezi ala.


N'ihi nka ka iwe Jehova di ọku n'aru ndi-Ya, O we setipu aka-Ya megide ha, tib͕ue ha, ugwu nile we ma jijiji, ozu ndi ahu we di ka ǹsí-anu n'etiti èzí nile. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


N'ihi na ọku ka Jehova gēji soro anu-aru nile, bú madu, je ikpé, Ọ gēji kwa mma-agha-Ya: ndi Jehova b͕uworo gaba uba.


ha gāb͕asa ha n'anyanwu, na n'ọnwa, na n'usu nile nke ihe elu-igwe, nke ha huworo n'anya, nke ha fèwo-kwa-ra, nke ha jesowo-kwa-ra, nke ha chọwo-kwa-ra, nke ha kpọwo-kwa-ra isi ala nye: agaghi-achikọta ha, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu nke di n'iru ala ka ha gāghọ.


Ewe were ya nye ka eme ya ka ọ nēb͕u maramara, ka ewe jide ya n'ọbu-aka: amuru nke ahu amu, bú mma-agha, eme-kwa-ra nke ahu ka ọ nēb͕u maramara, ka ewe nye ya n'aka onye nēb͕u eb͕u.


M'gētiye kwa nb͕a-aka-imi n'àb͕à-gi abua, me ka azù nke osimiri Nail i nile rapara n'akpirikpa-gi; M'gēme kwa ka i si n'etiti osimiri Nail i nile rigoputa, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile nke nārapara n'akpirikpa-gi.


M'gātusa kwa gi n'ọzara, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile: n'ọhia ka i gāda; agaghi - achikọta gi, agaghi-ekpokọta kwa gi: anu-ọhia nke uwa na anu-ufe nke elu-igwe ka M'wereworo gi nye ka i ghọ ihe-oriri.


Unu onwe-unu kwa, bú ndi Etiopia, ndi mma-agham b͕uru eb͕u ka ha bu.


Madu we si n'etiti ndi nile na ebo nile na asusu nile na mba nile puta nēle ozu-ha ubọchi atọ na nkera otù ubọchi, ha ekweghi kwa ka atọb͕ọ ozu-ha n'ílì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan