Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 25:32 - Bible Nso

32 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, ihe ọjọ nāpu si n'otù mba jerue mba ọzo, agākpọte kwa oké ifufe site na nsọtu nile nke uwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, mbibi na-agbasa site nʼotu mba na-eru na mba ọzọ; oke ifufe na-abịakwa site na nsọtụ niile nke ụwa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 25:32
12 Iomraidhean Croise  

Ewe tipia ha, mba megide mba, na obodo megide obodo: n'ihi na Chineke were nkpab͕u nile chusa ha.


Jehova gēme kwa ka anu ebube nke olu-Ya, Ọ gēme kwa ka ahu ndakwasi nke ogwe-aka-Ya, n'ọnuma nke iwe-Ya, na ire-ọku nke ọku nērichapu erichapu, na ntupia, na oké miri-ozuzo, na ákú-miri-ígwé.


N'ihi na iwe ka Jehova nēwesa mba nile, O wezugawo ha ka ebibie ha, O were ha nye ka eb͕ue ha.


ndi àkú-ha nile di nkọ, uta-ha nile ka azọrọ ukwu ikwe ha; aguwo ukwu inyinya-ha nile dika ọmu, na wheel-ha nile dika oké ifufe:


Ma Mu onwem, amaram ọlu nile ha na èchìchè nile ha: mb͕e nābia ijikọta mba nile na asusu nile; ha gābia kwa, hu ebubem.


Le, oké ifufe Jehova, bú ọnuma-Ya, apuwo, ọbuná oké ifufe nēfesi ike buruburu: n'isi ndi nēmebi iwu ka ọ gēfekwasi si-ike.


Le, oké ifufe nke Jehova, bú ọnuma-Ya, apuwo, ọ bu oké ifufe nke nēfechapu efechapu: n'isi ndi nēmebi iwu ka ọ gēfekwasi si-ike.


Otú a ka Jehova siri, Le, otù ndi nēsi n'ala Ugwu bia: mba uku ka agākpọte kwa site na nsọtu nile nke uwa.


Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ọ bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕o dika okè osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Zaion.


N'ihi nka cherenum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), cherenu ubọchi mb͕e M'gēbili ọtọ ikwata ihe: n'ihi na ikpém bu ime ka mba nile zukọta, ka M'we chikọta ala-eze nile, iwusa ha oké iwem, bú ọnuma nile nke iwem; n'ihi na agēji ọku nke ekworom ripia uwa nka nile.


Mb͕e ahu Ọ siri ha, Mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ:


Ihe-iriba-ama di iche iche gādi kwa n'anyanwu na ọnwa na kpakpando; n'elu uwa ka nkpab͕u nke mba di iche iche gādi kwa, ndi nọ n'obi abua n'ihi nbib͕o nke oké osimiri na ebili-miri;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan