Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 25:28 - Bible Nso

28 Ọ gēru kwa, mb͕e ha gāju inara iko ahu n'aka-gi iṅu, na i gāsi ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Unu aghaghi iṅu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 25:28
12 Iomraidhean Croise  

Ọ̀ bu site n'ebe i nọ ka Ọ gākwughachi, nke i nāju ya? N'ihi na gi onwe-gi gārọputa, ọ bughi mu onwem: Ma ihe i maworo, kwue ya.


M'we nara iko ahu n'aka Jehova, me ka mba nile ṅua, bú ndi Jehova zigaram jekuru:


O gēru kwa, na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè onye ahu, bú Nebukadneza eze Babilon, nke nāgaghi-etiye kwa olu-ya na yoke nke eze Babilon, M'gēji mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ajọ ọria nēfe efe, leta mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), rue mb͕e M'mere ka ha gwusia site n'aka-ya.


N'ihi nka ka uwa gēru újú, elu-igwe nke di n'elu gēji kwa nji: n'ihi na ekwubewom, ezubewom, echègharighkwam, M'gaghi-esi kwa nime ya laghachi azu.


N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, ndi anēkpeghi ikpe iṅu n'iko ahu aghaghi iṅu; ma gi onwe-gi, ì gābu kwa onye ahu nke anāmaghi ikpe ma-ọli? I gaghi-abu onye anāmaghi ikpe, n'ihi na i ghaghi iṅu.


Ala ahu we nāma jijiji, nāb͕ali kwa: n'ihi na èchìchè nile nke Jehova megide Babilon eguzosiwo ike, ime ka ala Babilon ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


ọ bu kwa ndi nile bi n'uwa ka anāgu n'ihe-efu: ọ bu kwa dika O si achọ ka Ọ nēme n'usu-ndi-agha nke elu-igwe, na n'etiti ndi bi n'uwa: ọ dighi kwa onye gēti aka-Ya ihe, si Ya, Gini ka I meworo?


N'ihi na dika unu ṅuworo ihe n'ugwu nsọm, otú a ka mba nile gāṅu ihe mb͕e dum, e, ha gāṅu, loda kwa, we di ka ha akādighi.


ka ha me ihe nile, ka ha ra, bú nke aka-Gi na ìzù-Gi buru uzọ ka àkà ka ha puta.


Nke eme-kwa-ra ayi ka ayi buru ihe-nketa nime Ya, ebe eburu uzọ ka ayi àkà dika Onye ahu zubere, Onye nālusi ihe nile ike dika ìzù nke ọchichọ-Ya si di;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan