Nke diri Kida, di-kwa-ra ala-eze nile nke Hezoa, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru. Otú a ka Jehova siri: Bilienu, rigorue Kida, punara umu Iru-anyanwu ihe-ha.
Camel nile ha gāghọ kwa ihe-nluta-n'agha, ìgwè anumanu-ha gāghọ kwa ihe-nkwata: M'gēfesa-kwa-ra ifufe nile ndi akọpuworo usọ isi-ha; ọ bu kwa n'ofè-ya nile ka M'gēme ka nhuju-anya-ha si bia; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Nke diri Edom. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Amam-ihe, ọ̀ dighi kwa na Timan ọzọ? ndum-ọdu, ọ̀ lanariwo ndi-nghọta n'iyì? amam-ihe-ha, àwusiwo ya?
bú Ijipt, na Juda, na Edom, na umu Amon, na Moab, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha, ndi bi n'ọzara: n'ihi na mba nile bu ndi anēbighi úgwù, ulo Israel nile bu kwa ndi anēbighi úgwù n'obi.
n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, M'gēseti kwa akam n'aru Edom, bipu nime ya madu na anumanu, me ya nkpọnkpọ ebe site na Timan; ọbuná rue Dedan ka ha gāda na mma-agha.