Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 25:2 - Bible Nso

2 bú okwu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara ndi Juda nile, gwa ndi nile bi na Jerusalem, si:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ya mere, ihe ndị a ka Jeremaya, bụ onye amụma gwara ndị Juda na ndị niile bi na Jerusalem:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 25:2
8 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, biko, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu onwem nākpu ihe ọjọ megide unu, nēchè kwa èchìchè megide unu: biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me kwa ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma.


Site n'arọ nke-iri-na-atọ nke Josaia nwa Emon, bú eze Juda, we rue ta, orú arọ na ato ndia, ka okwu Jehova ruworom nti, m'we gwa unu, nēbili n'isi-ututu nēkwu; ma unu anughi.


Otú a ka Jehova siri: Guzo n'ogige ulo Jehova, gwa obodo nile nke Juda, bú ndi nābia ikpọ isi ala n'ulo Jehova, okwu nile nke M'nyere gi n'iwu igwa ha; agubìla otù nime ha.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Je, si ndi Juda, si kwa ndi bi na Jerusalem, Ùnu agaghi-anara idọ-aka-na-nti ige nti okwum nile? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan