M'gēsuye kwa ọku n'olu nile nke chi nile nke Ijipt; o gēsure kwa ha ọku, dọta ha n'agha: ọ gēji kwa ala Ijipt kpuchie onwe-ya dika onye-ọzùzù-aturu si eji uwe-ya kpuchie onwe-ya; o gēsi kwa n'ebe ahu pua n'udo.
Nke diri Ijipt: bayere usu-ndi-agha nke Fero-neko, bú eze Ijipt, nke di n'akuku osimiri Yufretis nime Kakemish, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda.