Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 25:16 - Bible Nso

16 Ha gāṅu kwa, we ṅaghari, wi ara, n'ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n'etiti ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Mgbe ha ṅụrụ ya, ha ga-adagharị, malitekwa ịyị ara nʼihi mma agha, nke m ga-ezite nʼetiti ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 25:16
16 Iomraidhean Croise  

I gāgwa kwa ha okwu a, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Agāb͕aju ite ọ bula manya-vine: ha gāsi kwa gi, Ọ̀ bu na ayi amaghi na agāb͕aju ite ọ bula manya-vine?


M'gātupia kwa ha, otù onye n'elu ibe-ya, ọbuná ndi bu nna na umu-ha n'otù; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: M'gaghi-enwe ọmiko, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa obi-ebere, ka M'we ghara ibibi ha.


I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ṅuanu, ṅubiga ókè, b͕ọ ab͕ọ, da, unu ebili-kwa-la ọzọ, n'ihi mma-agha ahu nke Mu onwem nēziga n'etiti unu.


Ma gi onwe-gi, ì nāchọrọ onwe-gi ihe uku? achọla ha: n'ihi na, le, M'gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi anu-aru nile, bú madu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma M'gēnye gi ndu-gi ka ọ buru ihe-nkwata n'ebe nile i gēje.


Menu ya ka ọ ṅubiga manya ókè; n'ihi na ọ bu Jehova ka o mere onwe-ya ka ọ di uku megide: Moab gāturu kwa onwe-ya n'ihe ọ b͕ọrọ, ọ gāghọ kwa ihe-ọchì, ọbuná ya onwe-ya.


N'okpom-ọku-ha ka M'gēme ọṅuṅu-manya nile ha, mee ka ha ṅubiga manya ókè, ka ha we ṅuria ọṅu-agha, raru ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Iko ọla-edo ka Babilon buworo n'aka Jehova, nke nēme ka uwa nile ṅubiga manya ókè: ufọdu nime manya-vine-ya ka mba di iche iche ṅuworo; n'ihi nka ka mba di iche iche nāwi ara.


O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ.


Ka obi nātọ gi utọ, ṅuria ọṅu, gi ada Edom, nke bi n'ala Uz: Ọbuná gi ka iko gāgabigaru: i gāṅubiga manya ókè, b͕aba onwe-gi ọtọ.


N'ihi na dika unu ṅuworo ihe n'ugwu nsọm, otú a ka mba nile gāṅu ihe mb͕e dum, e, ha gāṅu, loda kwa, we di ka ha akādighi.


Gi onwe-gi gāṅubiga kwa manya ókè, i gābu onye zoro ezo; gi onwe-gi gāchọ kwa ebe siri ike, n'ihi onye-iro.


ya onwe-ya gāṅu kwa nime manya nke ọnuma Chineke, nke edoziworo nāgwaghi-agwa nime iko nke iwe-Ya; agēji kwa ọku na brimstone mekpa ya aru n'iru ndi-mọ-ozi di nsọ, na n'iru Nwa-aturu ahu:


Mọ-ozi ọzọ, bú nke-abua, we so, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, nke meworo ka mba nile ṅua nime manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya.


N'ihi na mba nile adawo site na manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya; ndi-eze uwa so-kwa-ra ya kwa iko, ndi-ahia nke uwa buru ọgaranya site n'ike nke inupu-isi-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan