Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 25:10 - Bible Nso

10 Ọzọ, M'gēme ka olu obi-utọ, na olu ọṅù, na nwoke nālu nwunye ọhu, na olu nwanyi anālu ọhu, na olu nkume-igwe-nri, na ìhè oriọna, lanari ha n'iyì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 25:10
14 Iomraidhean Croise  

Ewe site n'aka ndi-ọb͕a-ọsọ ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ndi-Ju nile la n'iyì, site na nwata we rue okenye, ma umu-ntakiri ma ndinyom, n'otù ubọchi, n'ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, na iluta ihe-nkwata-ha n'agha.


n'ihi na erewo ayi, bú mu onwem na ndim, ikpochapu ayi, na ib͕u ayi, na ime ka ayi la n'iyì. Ma asi na erewo ayi ibu ndi-orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, m'gāb͕a nkiti, ọ bu ezie na onye-nkpab͕u agaghi-emezu n'ihe gēfunari eze.


bú akwukwọ nke eze kwere nime ha ka ndi-Ju ndi nọ n'obodo nile ọ bula kpọkọta onwe-ha, guzo kwa n'ihi ndu-ha, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ha la n'iyì, bú usu-ndi-agha nile nke ndi ahu na ala ahu anāchi achi ndi nākpab͕u ha, ma umu-ntakiri-ha, ma ndinyom-ha, na iluta ihe-nkwata-ha n'agha,


Were nkume-igwe-nri gwe utu ọka: kpupu ákwà-nkpuchi-gi, yipu uwe-nwuda-gi, kpughepu ogwe-ukwu-gi, gabiga osimiri di iche iche.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nwoke nālu nwunye ọhu na olu nwanyi anālu ọhu kwusi n'ebe a n'anya-unu na n'ubọchi-unu.


Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọṅù n'ubi ọma na n'ala Moab; emewokwam ka manya-vine kwusi n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile: ọ dighi onye gēji iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine zọcha nkpuru-vine; iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine agaghi-abu iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine.


M'gēme kwa ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu kwusi n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: n'ihi na nkpọnkpọ ebe ka ala nka gāghọ.


Obi-utọ nke obi-ayi akwusiwo; Otite-egwú-ayi ab͕anwewo n'ib͕a-nkpe.


M'gēme kwa ka ùzù nke abù-gi nile kwusi; agaghi-anu kwa olu nke ubọ-akwara-gi nile ọzọ.


M'gēme kwa ka obi-utọ ya nile kwusi, ya na ememe-ya, na ọnwa ọhu ya, na ubọchi-izu-ike-ya, na mb͕e-ya nile akara àkà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan