Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 24:2 - Bible Nso

2 Fig nke di nma nke-uku di n'otù nkata, dika fig nke buru uzọ cha: ma fig nke jọrọ njọ nke-uku di na nkata nke-ọzọ, nke anāgaghi-eri, site n'ijo-njọ-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Otu nkata nwere mkpụrụ fiig mara mma, dịka ndị ahụ na-ebu ụzọ acha, nkata nke ọzọ nwere mkpụrụ fiig nke jọrọ njọ, ha jọrọ njọ na mmadụ enweghị ike ịracha ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 24:2
11 Iomraidhean Croise  

Gini ka agēme ubi-vine nkem ọzọ, nke m'nēmeghi nime ya? gini mere, mb͕e m'lere anya na ọ gāmi nkpuru-vine, o ji mia nkpuru-vine ọhia?


N'ihi na ubi-vine nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu ulo Israel, ndi Juda bu kwa ihe-ọkukú nātọ Ya utọ nke-uku: O we le anya ikpe ziri ezi, ma, le, nwusi-ọbara; O lere anya ezi omume, ma, le, iti-nkpu.


otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Le, M'gaje iziga n'etiti ha mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe, M'gēme kwa ha ka ha di ka fig jọb͕uru onwe-ha, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha.


Dika nkpuru-vine n'ọzara ka M'chọtara Israel; dika nkpuru nke buru uzọ cha n'osisi fig n'oge mbu ya ka M'huru nna-unu-hà: ma ha onwe-ha biakutere Beal-peoa, kewaputa onwe-ha nye ihere ahu, ghọ ihe-árú dika ihe ahu ha huru n'anya.


Ahuhu dirim! n'ihi na Adiwom ka mb͕e ha ghọkọtaworo nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru, dika ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke ọghughọ-nkpuru-vine: ọ dighi otù uyọkọ nkpuru-vine fọduru iri; nkpuru-osisi fig nke buru uzọ cha ka nkpuru-obim chọsiworo ike.


Ebe-gi nile ewusiri ike gādi ka osisi fig nwere nkpuru-osisi fig buru uzọ cha: ọ buru na arùru ha arù, ha adabá n'ọnu onye nēri ha.


Nkpuru mbu nke ihe nile di n'ala-ha, nke ha nēwetara Jehova, nke gi ka ọ bu; onye ọ bula nke di ọcha n'ulo-gi gēri ya.


Unu onwe-unu bu nnú nke uwa: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ ghọ ezi nnú? ọ dighi kwa irè iji me ihe ọ bula ọzọ, ma-ọbughi ka etufue ya n'èzí, madu azọ ya ukwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan