Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 24:1 - Bible Nso

1 Jehova we me ka m'hu, ma, le, nkata fig abua adọbara n'iru ulo uku nke Jehova; mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, mesiri ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi-isi Juda, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ, we me ka ha biarue Babilon.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Emesịa, Onyenwe anyị gosiri m nkata fiig abụọ, nke a dọbara nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nʼoge a, Nebukadneza eze Babilọn esitelarị na Jerusalem dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, eze Juda, na ndịisi Juda, na ndị ọka, na ndị ụzụ, mee ka ha gaa biri na Babilọn, nke dị na mba ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 24:1
22 Iomraidhean Croise  

Na mb͕e ahu ka ndi-orù Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoruru Jerusalem, ewe nọchigide obodo ahu n'agha.


Ma n'ọb͕ub͕a arọ, eze, bú Nebukadneza, zìri, me ka ọ biarue Babilon, ya na ihe nile anāchọsi ike nke ulo Jehova, o we me Zedakaia, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem.


Ibu eboro Babilon, nke Aisaia nwa Emoz huru.


Emechiwo obodo nile nke Negeb, ọ dighi kwa onye nēmeghe ha: emewo ka Juda je biri n'ala ọzọ, ha nile emezuwo ka ọ je biri n'ala ọzọ.


nke Nebukadneza, bú eze Babilon, nāchighi, mb͕e o mere ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, si na Jerusalem je biri na Babilon, ya na ndi Juda na Jerusalem nile amara aha-ha;


ọzọ, Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi bàworo na Babilon, ndia ka Mu onwem gaje ime ka ha lata n'ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na M'gab͕aji yoke nke eze Babilon.


Ma ndia bu okwu nke akwukwọ ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, si na Jerusalem zigara ndi-okenye fọduru nime ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, nke o ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-amuma, ziga-kwa-ra ndi Israel nile, ndi Nebukadneza mere ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon:


(mb͕e Jekonaia, bú eze, na eze-nwanyi, na ndi-onozi, na ndi-isi Juda na Jerusalem, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, pusiri na Jerusalem;)


Zedekaia nwa Josaia we ghọ eze n'ọnọdu Konaia nwa Jehoiakim, onye Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka ọ buru eze n'ala Juda.


ọnu nke alaka-ya nile wara ọhu ka ọ kubipuru, būru ba n'ala izu-ahia; n'obodo ndi-ahia ka o doro ya.


Ha we tiye ya n'ulo-nmechibido na nb͕a-aka-imi, me ka ọ biakute eze Babilon; ha nēme ka ọ ba n'ebe ewusiri ike, ka ewe ghara inu kwa olu-ya ọzọ n'ugwu nile nke Israel.


N'ezie Onye-nwe-ayi Jehova agaghi-eme ihe, ma ọ buru na O kpugheghi ìzù nzuzo Ya nye ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma-Ya.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m'hu: ma, le, Ọ nākpu igurube n'isi-nmalite nke opupú ahihia nke miri-ozuzo ikpe-azu; ma, le, ọ bu ahihia nke miri-ozuzo ikpe-azu mb͕e ebìsiri ahihia eze.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova mere ka m'hu: ma, le, Jehova nākpọ òkù ka Ya na ndi-Ya kpe ikpe site n'ọku; o we ripia oké ob͕u-miri, we nēripia òkè a, bú ala Israel.


Otú a ka O mere ka m'hu: ma, le, Onye-nwe-ayi nēguzo Onwe-ya n'akuku mb͕idi ejiri opù eji atù mb͕idi lua, ọ bu kwa n'aka-Ya ka opù eji atù mb͕idi di.


Jehova we me ka m'hu ndi-ọ̀kà anọ.


Ọ we me ka m'hu Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, ka ọ nēguzo n'iru mọ-ozi nke Jehova, na Setan, ka o nēguzo n'aka-nri-ya imegide ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan