Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 23:8 - Bible Nso

8 kama ha gāsi, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka nkpuru ulo Israel si n'ala Ugwu na n'ala nile ebe M'chusara ha-ri rigoputa, bata; ha gēbi kwa n'elu ala nke aka ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 23:8
24 Iomraidhean Croise  

Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Onye-nwe-ayi gēseti kwa aka-Ya ọzọ nke ub͕ò abua inweta ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n'Asiria, site kwa n'Ijipt, site kwa na Patros, site kwa na Kush, site kwa n'Ilam, site kwa na Shaina, site kwa na Hemat, site kwa n'agwe-etiti nile nke oké osimiri.


N'ihi na Jehova gēnwe obi-ebere n'aru Jekob, Ọ gārọputa kwa Israel ọzọ, do ha n'ala-ha: ọbìa gārapara kwa n'aru ha, ha gēme kwa onwe-ha ka ha na ulo Jekob dikọ n'otù.


N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na agaghi-asi kwa ọzọ, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n'ala Ijipt rigoputa;


kama agāsi, Jehova nādi ndu, bú Onye mere ka umu Israel si n'ala Ugwu na n'ala nile ebe Ọ chusara ha-ri rigoputa: M'gēme kwa ka ha lata n'ala ahu nke M'nyere ndi bu nna-ha.


Mu onwem gāchikọta kwa ìgwè ewu na aturu nkem fọduru site n'ala nile ebe M'chusaworo ha, M'gēme kwa ka ha lata n'ebe-ita-nri-ha; ha gāmu kwa ọmùmù, ba uba.


M'gēkwe kwa ka unu chọtam, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēme kwa ka ndi-unu adọtara n'agha lata, M'gēsi kwa na mba nile, na n'ebe nile M'chugaworo unu, chikọta unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka unu lata n'ebe ahu nke M'mere ka unu si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ.


Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n'ihi na, le, M'gaje izọputa gi n'ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n'ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n'aru bū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.


N'ihi na, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka ndim lata, bú Israel na Juda, ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); M'gēme kwa ka ha lata n'ala ahu nke M'nyere ndi bu nna-ha, ha gēnweta kwa ya.


Le, M'gaje ime ka ha si n'ala Ugwu bia, M'gāchikọputa kwa ha na nsọtu nile nke uwa, n'etiti ha ka onye-ìsì na onye-ngwurọ na nwanyi di ime na nwanyi ime nēme gānọ n'otù: na nkpọkọta uku ka ha gālata n'ebe a.


si, Le, M'gaje ichikọputa ha n'ala nile, ebe M'chugaworo ha n'iwem, na n'ọnumam, na n'oké iwe di uku; M'gēme kwa ka ha lata n'ebe a, me kwa ka ha biri na ntukwasi-obi:


Ha gārọputa kwa ọnwu kari ndu, bú ndi nile fọduru, ndi fọduru site n'ab͕uru ọjọ a, ndi fọduru n'ebe nile M'chusaworo ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke ndi-agha puta.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M'gāchikọputawori ulo Israel n'etiti ndi nile di iche iche, bú ndi ha b͕asaworo n'etiti ha, mb͕e agēdoworim nsọ nime ha n'anya mba nile, ha gēbi kwa n'elu ala-ha, nke M'nyere orùm, bú Jekob.


M'gēme kwa ka ha si na ndi nile di iche iche puta, M'gāchikọputa kwa ha n'ala nile, me ka ha ba n'ala-ha; M'gāzù kwa ha n'ugwu nile nke Israel, na n'akuku ebe nile miri si erù, na n'ebe-obibi nile nke ala-ha.


M'gēweputa kwa unu n'etiti mba nile, chikọputa kwa unu n'ala nile, me ka unu bata n'ala-unu.


Ha gāsi kwa, Ala nka nke tọb͕ọrọ n'efu aghọwo ubi dika ubi Iden ab͕ara ogige; ọzọ, obodo nile nke bu nkpọnkpọ, nke tọb͕ọrọ n'efu, nke akwaturu n'ala, ha aghọwo ebe ewusiri ike nke madu bi nime ha.


Ha gēbi kwa n'ala ahu nke M'nyeworo orùm, bú Jekob, nke nna-unu-hà biri nime ya; ha gēbi kwa nime ya, ha onwe-ha, na umu-ha, na umu umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi: Devid, bú orùm, gābu-kwa-ra ha onye-isi rue mb͕e ebighi-ebi.


Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, ebe M'mere ka ha je biri n'ala ọzọ n'etiti mba nile, M'we chikọba ha n'ala-ha; M'gaghi-eme kwa ka onye ọ bula nime ha fọdu n'ebe ahu ọzọ;


le, M'gaje isi n'ebe ahu ebe unu nērega ha-ri kpọte ha, nyeghachi nmesò-unu n'isi-unu;


Dika n'ubọchi i siri n'ala Ijipt puta, otú a ka M'gēme ka ọ hu oké ọlu di iche iche.


Na mb͕e ahu ka M'gēme ka unu bata, ọ bu kwa na mb͕e ahu ka M'gāchikọta unu: n'ihi na M'gēme ka unu ghọ aha, ghọ kwa otuto n'etiti ndi nile di iche iche nke uwa, mb͕e M'gēme ka ndi-unu adọtara n'agha lata n'anya-unu, ka Jehova siri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan