Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 23:40 - Bible Nso

40 M'gētiyekwasi kwa unu ita-uta di mb͕e ebighi-ebi, ya na itiye n'ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi, nke agaghi-echezọ echezọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

40 Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 23:40
10 Iomraidhean Croise  

Ma Jehova nọyerem dika dike nke nēme ka ama jijiji: n'ihi nka ndi nēsob͕um gāsu ngọngọ, ha agaghi-enwe kwa ike: ihere gēme ha nke-uku, n'ihi na ha enweghi uche, agaghi-echezọ ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi nke etiyere ha.


M'gēwere ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, iburu ha ihe ọjọ; ibu ihe-ita-uta, na ilu, na ihe-àkùkù, na ihe-nkọcha, n'ebe nile M'gāchusa ha.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.


Gi onwe-gi kwa, būru ihere-gi, ebe i kpeworo uche-gi bayere umu-nne-gi ndinyom; site na nmehie-gi nile nke i meworo ihe-árú na ha kari ha, ha bu ndi ezi omume kari gi: e, gi onwe-gi kwa, ka ihere me gi, būru kwa ọnọdu-ihere-gi, n'ihi na i guworo umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume.


Ọzọ, ọtutu madu nime ndi nāraru ura n'ala, bú ájá, gēteta, ufọdu ibà na ndu ebighi-ebi, ufọdu ibà n'ita-uta riri nne na oyi agāsọ ha nke-uku mb͕e ebighi-ebi.


Onye-nwe-ayi, dika ezi omume-Gi nile si di, biko, ka iwe-Gi na ọnuma-Gi si n'obodo-Gi, bú Jerusalem, bú ugwu nsọ Gi, laghachi: n'ihi na ọ bu n'ihi nmehie nile ayi, na n'ihi ajọ omume nile nke nna-ayi-hà, ka Jerusalem na ndi-Gi ghọworo ihe-ita-uta nye ndi nile di ayi buruburu.


Dika iba-uba-ha, otú a ka ha mehieworo megidem: nsọpuru-ha ka M'gāb͕anwe ka ọ ghọ ihere.


I gāghọ kwa ihe-iju-anya, na ilu, na ihe-àkùkù, n'etiti ndi ahu nile ebe Jehova gēdu gi je.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan