Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 23:30 - Bible Nso

30 N'ihi nka, le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọbu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nēzu okwum nile n'ori, onye ọ bula n'aka ibe-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Nʼihi ya, Onyenwe anyị kwubiri sị, “Ana m edo onwe m megide ndị amụma na-esite nʼọnụ ibe ha na-ezute okwu ha na-ekwu, ma na-asị na ọ bụ nʼọnụ m ka ha si nata ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 23:30
14 Iomraidhean Croise  

Iru Jehova nēmegide ndi nēme ihe ọjọ, Ibipu ncheta-ha n'uwa.


Le, Mu nēmegide gi, gi nwayi bi na ndagwurugwu, gi oké nkume nke ebe di lari, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); unu ndi nāsi, Ònye gāridata imegide ayi? ma-ọbu ònye gābata n'ebe-obibi nile ayi?


Le, Mu nēmegide ndi-amuma, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nēwere ire-ha kwue ihe, si, Ọ bu ihe si Ya n'ọnu puta.


N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M'gaje ido irum imegide unu ime unu ihe ọjọ, ọbuná ibipu Juda nile.


Ma nka gāburu unu ihe-iriba-ama, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na Mu onwem nēji nmehie-unu leta unu n'ebe a, ka unu we mara na okwum nile aghaghi iguzosi ike imegide unu ime unu ihe ọjọ:


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide ohiri-isi nile unu, nke unu onwe-unu ji achu ntá nkpuru-obi madu n'ebe ahu dika anu-ufe, M'gādọwapu kwa ha n'ogwe-aka-unu; M'gēzilaga kwa nkpuru-obi nile, bú nkpuru-obi unu onwe-unu nāchu ntá dika anu-ufe.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na unu ekwuwo okwu efu, hu ọhù ugha, n'ihi nka, le, Mu nēmegide unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


M'gēche kwa irum imegide ha; ọku ka ha siworo puta, ma ọku gēripia ha; unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'doro irum imegide ha.


Mu onwem gēche kwa irum megide nwoke ahu, bipu ya n'etiti ndi-ya; n'ihi na ufọdu nime nkpuru-ya ka o nyeworo Molek, ka o we meru ebe nsọm, na ime ka aha nsọm ghara idi nsọ.


M'gēche irum imegide unu, agētib͕u kwa unu n'iru ndi-iro-unu: ndi nākpọ unu asì gāzọda unu; unu gāb͕alaga kwa mb͕e ọ nādighi onye nāchu unu.


Ma onye-amuma nke gēwere nganga kwu okwu n'aham, nke M'nēnyeghi ya iwu ikwu, ma-ọbu nke gēkwu n'aha chi di iche iche ọzọ, onye-amuma ahu gānwu kwa.


Jehova agaghi-ekwe ib͕aghara ya, kama mb͕e ahu iwe Jehova na ekworo-Ya gākwu anwuru-ọku imegide nwoke ahu, ọb͕ub͕a-iyi nile edeworo n'akwukwọ a gāmakpu kwa n'aru ya, Jehova gēhichapu kwa aha-ya n'okpuru elu-igwe.


N'ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n'aru ndi ezi omume, Nti-Ya abua di kwa n'ebe aririọ-ha di: Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan