Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 23:20 - Bible Nso

20 Iwe Jehova agaghi-alaghachi azu, rue mb͕e O mere ya, ru kwa mb͕e O mere ka ihe-nzube nile nke obi-Ya guzosie ike: na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia unu gāghọta ya nke-ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Onyenwe anyị agaghị akwụsị iwe iwe ya tutu ruo mgbe o mezuru ihe niile dị ya nʼobi. Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa nʼihu, unu ga-aghọta ihe ndị a niile nke ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 23:20
18 Iomraidhean Croise  

Jekob we kpọ umu-ya ndikom òkù, si: Chikọtanu onwe-unu, ka m'we gosi unu ihe gādakwasi unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.


ha we chegharia n'obi-ha n'ala ebe adọtara ha n'agha, we chigharia, riọ Gi amara n'ala ndi nādọta ha n'agha, si, Ayi emehiewo, me ajọ omume, mebie iwu-Gi;


Otú ọ di, Jehova esighi n'idi-ọku iwe uku Ya laghachi, nke iwe-Ya ji di ọku megide Juda, n'ihi nkpasu-iwe nile nke Manase kpasuru Ya.


Jehova we si, M'gēsi kwa n'irum wezuga Juda, dika M'wezugara Israel, M'gāju kwa obodo a nke M'rọputaworo, bú Jerusalem, na ulo ahu nke M'siri, Aham gādi n'ebe ahu.


Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha aṅuwo iyi, si, N'ezie dika M'chèworo, otú a ka ọ gādi; na dika M'zubeworo, nke ahu gēguzosi ike:


otú a ka okwum di nke nēsi n'ọnum puta: ọ gaghi-alaghachikutem n'efu, ma ọ buru na o bughi uzọ mezu ihe tọrọm utọ, we ga nke-ọma n'ihe M'zigara ya.


Iwe di ọku nke Jehova agaghi-alaghachi azu, rue mb͕e O mesiri, ru kwa mb͕e O mesiri ka nzube nile nke obi-Ya guzosie ike: na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia ka unu gāghọta ya.


N'ihi nka ka uwa gēru újú, elu-igwe nke di n'elu gēji kwa nji: n'ihi na ekwubewom, ezubewom, echègharighkwam, M'gaghi-esi kwa nime ya laghachi azu.


Bulienu ọkọlọtọ n'ebe mb͕idi nile nke Babilon di, menu ka nche sie ike, menu ka ndi-nche guzosie ike, dozienu uju nēru nbì; n'ihi na Jehova ezubewo me kwa ihe O kwuru megide ndi bi na Babilon.


amuru ya amu ka o we b͕ue madu nke-uku; emere ya ka ọ nēb͕u maramara ka o we di ka àmùmà: òbi gatọ kwa ayi utọ? nkpa-n'aka nwam, ọ nāju osisi nile ọ bula.


anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, amiputawo mma-agham n'ọbọ-ya; ọ gaghi-alaghachi kwa ọzọ.


Ma otú ọ di, okwum nile na ukpurum nile nke M'nyere ndi-orùm, bú ndi-amuma, n'iwu, hà erughi nna-unu-hà aru? ha we chigharia, si, Dika Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubere ime ayi, dika uzọ nile ayi si di, na dika omume nile ayi si di, otú a ka O mesoworo ayi.


Mb͕e nkpab͕u diri gi, mb͕e ihe nile ndia abiakwasiwo-kwa-ra gi, na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia i gālaghachikuru kwa Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa olu-Ya nti:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan