Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 23:15 - Bible Nso

15 N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ndia, si: Le, M'gaje ime ka ha rie wormwood, M'gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí; n'ihi na ndi-amuma nke Jerusalem ka nmeru puworo je rue ala nka nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a, “Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu, meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi, nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 23:15
12 Iomraidhean Croise  

Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm; Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m'ṅua manya-vine b͕ara uka.


N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ahu ndi nēbu amuma n'aha m, ma Mu onwem eziteghi ha, ma ha onwe-ha nāsi, Mma-agha na oké unwu agaghi-adi n'ala nka: Ọ si, Agēji mma-agha, ji kwa oké unwu, me ka ndi-amuma ahu gwusia.


N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi nānọdu ala? chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba n'obodo nile ewusiri ike, we debe ọnu-ayi du n'ebe ahu: n'ihi na Jehova, bù Chineke-ayi, emewo ka ayi debe ọnu-ayi du, O mewo kwa ka ayi ṅua miri ńsí, n'ihi na ayi emehiewo megide Jehova.


ma ha ejesowo isi-ike nke obi-ha, jeso kwa Bealim, nke ndi bu nna-ha zíri ha:


n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a, Le, M'gaje ime ka ha, bú ndi nka, rie wormwood, M'gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí.


O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ.


Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí.


O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu.


Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M'gēbipu aha nile nke arusi nile n'ala nka, agaghi-echeta kwa ha ọzọ: ọzọ kwa, M'gēme ka ndi-amuma na mọ nke iru-árú si n'ala nka gabiga.


ha we nye Ya manya-vine nke agwara òlùlù ka Ọ ṅua: ma mb͕e O deturu ya ire, Ọ chọghi ka Ọ ṅua.


ka nwoke, ma-ọbu nwayi, ma-ọbu ab͕uru, ma-ọbu ebo, we ghara idi n'etiti unu, nke obi-ya nēchigharí pua ta n'ebe Jehova, bú Chineke-ayi, nọ, ije ifè chi nile nke mba ahu nile òfùfè; ka nkpọrọgwu nke nāmi ńsí na wormwood we ghara idi n'etiti unu;


aha anākpọ kwa kpakpando ahu bu Wormwood: otù uzọ n'uzọ atọ nke miri nile we ghọ wormwood; ọtutu madu we site n'iṅu miri ahu nwua, n'ihi na emere ka ha nēlu ilu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan