Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 23:14 - Bible Nso

14 Ọzọ, n'aru ndi-amuma Jerusalem ka M'huworo ihe jọb͕uru onwe-ya; ha nākwa iko, nējeghari kwa n'okwu-ugha, ha emewo kwa ka aka ndi nēme ihe ọjọ di ike, ha we ghara isi, onye ọ bula n'ihe ọjọ ya, lata: ha nile aghọworom ihe di ka Sọdọm, ndi bi nime ya aghọwo-kwa-ram ihe di ka Gọmọra.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem. Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha. Ha na-agba ndị ajọ omume ume, si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa. Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ; ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 23:14
45 Iomraidhean Croise  

Ma ndi Sọdọm bu ndi ọjọ na ndi-nmehie megide Jehova nke-uku.


Jehova we si, Iti-nkpu Sọdọm na Gọmọra, o riri nne n'ezie, nmehie-ha kwa, ọ di arọ́ nke-uku n'ezie;


Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ;


O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n'obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala.


Okenye nke anāhu kwa iru-ọma, onye ahu bu isi; onye-amuma kwa nke nēzí okwu-ugha, onye ahu bu ọdudù.


Jehova we sim, Amuma ugha ka ndi-amuma nēbu n'aham: eziteghm ha, enyekwaghm ha iwu, agwakwaghm ha okwu: amuma ọhù ugha, na nke iju arusi ase, na nke ihe-efu, na nke aghughọ nke obi-ha, ka ha nēburu unu.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Biko, juanu n'etiti mba nile, si, Ònye nuworo ihe di ka ndia? ihe jọb͕uru onwe-ya nke-uku ka nwa-ab͕ọghọ Israel nke nāmaghi nwoke meworo.


Ka nwoke ahu di kwa ka obodo nile nke Jehova kwaturu, ghara ichèghari: ya nu kwa iti-nkpu n'ututu, na iti-nkpu agha n'etiti-ehihie;


Ha nọ nāsi ndi nēlelìm, Jehova ekwuwo okwu, si, Udo gādiri unu; ọ bu kwa onye ọ bula nke nējeghari n'isi-ike nke obi-ya ka ha siworo, Ihe ọjọ agaghi-abiakwasi unu.


Ma ọ buru na ha guzori n'ìzù nzuzo nkem, ha gēmewori ka ndim nuru okwum nile, ha gēmewori kwa ka ha si n'uzọ ọjọ ha na n'ihe ọjọ nke omume nile ha, lata.


Le, Mu nēmegide ndi nēbu amuma nrọ ugha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha we ze ha, me ka ndim kpafue site n'okwu-ugha nile ha na n'obi-ha nādighi n'otù ebe: ma Mu onwem eziteghi ha, enyeghkwam ha iwu; ọ dighi kwa urù ha gābara ndi nka ma-ọli; ọ bu ihe si n'onu Jehova puta.


Okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere Ehab nwa Kolaia, baye-kwa-ra Zedekaia nwa Maaseia, ndi nēburu unu amuma ugha n'aham, si: Le, M'gaje inye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon; o gētib͕u kwa ha n'anya-unu;


n'ihi na ha emewo ihe-nzuzu n'Israel, we kwa nwunye ndikom-ibe-ha iko, kwu kwa okwu n'aham n'ugha, bú nke M'nēnyeghi ha n'iwu; ma Mu onwem bu onye mara, na onye-àmà; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Were n'onwe-gi akwukwọ-npiakọta, de nime ya okwu nile nke M'gwaworo gi imegide Israel, na imegide Juda, na imegide mba nile, site n'ubọchi M'gwara gi okwu, site n'ubọchi Josaia, we rue ta.


Dika nkwatu nke Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.


Ajọ omume nke ada ndim we di uku kari nmehie Sọdọm, Nke akwaturu dika n'otù ntabi-anya, ma ọ dighi aka ọ bula dakwasiri ya.


bú ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma bayere Jerusalem, ndi nāhu-kwa-ra ya ọhù udo, ma udo adighi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Unu we me ka M'ghara idi nsọ n'etiti ndim n'ihi nju-aka ọka barley na n'ihi iberibe achicha, ime ka nkpuru-obi nwua, bú ndi nēkwesighi inwu anwu, na ime ka nkpuru-obi di ndu, bú ndi nēkwesighi idi ndu, site n'okwu-ugha unu nāgwa ndim ndi nānu okwu-ugha.


Nkekọta ọjọ nke ndi-amuma-ya di n'etiti ya, dika ọdum nāb͕ọ uja nke nādọb͕u anu-ndọb͕u: nkpuru-obi madu ka ha ripiaworo; àkù na ihe di oké ọnu-ahia ka ha nēwere; ha emewo ka ndinyom-ya di-ha nwuru ba uba n'etiti ya.


N'ulo Israel ka M'huworo ihe jọb͕uru onwe-ya: n'ebe ahu ka ikwa-iko nke Efraim nākwa di, emeruwo Israel.


Akwatuwom ufọdu n'etiti unu, dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra, unu we di ka ọlọkọ-ọku alọputara n'orire-ọku: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi njehie Jekob ka ihe a nile di, na n'ihi nmehie nile nke ulo Israel. Gini bu njehie Jekob? ọ̀ bughi Sameria? gini bu kwa ebe di elu nile nke Juda? hà abughi Jerusalem?


Ndi-isi-ya nēkpe ikpe n'ihi iri-ngo, ndi-nchu-àjà-ya nēzí ihe n'ihi ugwọ, ndi-amuma-ya nāju ase n'ihi ego: ma na Jehova ka ha nādabere, si, Jehova, Ọ̀ nọghi n'etiti ayi? ihe ọjọ agaghi-abiakwasi ayi.


Ndi-amuma-ya bu ndi obi-ha nādighi n'otù ebe, ndi-nghọb͕u: ndi-nchu-àjà-ya emewo ka ihe nsọ ghara idi nsọ, ha emewo iwu ihe-ike.


Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M'gēbipu aha nile nke arusi nile n'ala nka, agaghi-echeta kwa ha ọzọ: ọzọ kwa, M'gēme ka ndi-amuma na mọ nke iru-árú si n'ala nka gabiga.


Ibu okwu Jehova eboro Israel site n'aka Malakai.


Otú ọ di, asim unu, na ala Sọdọm gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari gi.


N'ihi na ọ bu n'osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere, Site kwa n'ubi Gọmọra: Nkpuru-vine-ha bu nkpuru-vine ńsí, Uyọkọ di ilu ka ha nwere:


site n'iru-abua nke ndi nēkwu okwu-ugha, ndi eji ígwè ọku da ha n'akọ-na-uche nke aka ha;


O we me ka obodo Sọdọm na Gọmọrra ghọ ntu, were kwa ikpù-iru ma ha ikpé, ebe O mere ha-ri ka ha buru ihe-ilere-anya nye ndi gaje ibu ndi nādighi-asọpuru Chineke;


Dika Sọdọm na Gọmọra, na obodo di ha gburugburu, ebe ha rara onwe-ha nye n'ikwa-iko n'uzọ di otú ndia mere, we pua so anu-aru di iche, edebewo ha n'iru ọra madu dika ihe-ngosi, nāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpé ziri ezi, nke bu ọku ebighi-ebi.


Ozu-ha we di n'amá nke obodo uku ahu, bú nke anākpọ Sọdọm na Ijipt n'uzọ nke Mọ Nsọ, ebe akpọgide-kwa-ra Onye-nwe-ha n'obe.


Ewe jide anu-ọhia ahu, ya na onye-amuma ugha ahu nke nēme ihe-iriba-ama ahu n'iru ya, bú nke o ji duhie ndi natarari akàrà nke anu-ọhia ahu, na ndi nākpọ isi ala nye ihe-oyiyi-ya: ewe tubà ha abua na ndu nime ọdọ ọku ahu nke ji brimstone nēre:


Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.


N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan