Jeremaya 22:30 - Bible Nso30 Otú a ka Jehova siri, Denu nwoke a n'akwukwọ na ọ bu onye b͕a aka nwa, bú nwoke nke ihe nāgaghi-agara nke-ọma n'ubọchi-ya nile: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nime nkpuru-ya ihe gāgara nke-ọma, nke ganānọkwasi n'oche-eze Devid, nāchi kwa achi ọzọ na Juda. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a30 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: “Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa, nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile, nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma, o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid, maọbụ chịakwa ọzọ na Juda.” Faic an caibideil |
N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iji nmehie Shemaia onye-Nehelamait leta ya, leta kwa nkpuru-ya; ọ gaghi-enwe nwoke ọ bula nēbi n'etiti ndi nka, ọ gaghi-elekwasi kwa ezi ihe ahu anya, bú nke Mu onwem nēmere ndim, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na okwu nwezuga ka o kwuworo megide Jehova.