Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 22:30 - Bible Nso

30 Otú a ka Jehova siri, Denu nwoke a n'akwukwọ na ọ bu onye b͕a aka nwa, bú nwoke nke ihe nāgaghi-agara nke-ọma n'ubọchi-ya nile: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nime nkpuru-ya ihe gāgara nke-ọma, nke ganānọkwasi n'oche-eze Devid, nāchi kwa achi ọzọ na Juda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: “Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa, nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile, nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma, o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid, maọbụ chịakwa ọzọ na Juda.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 22:30
11 Iomraidhean Croise  

Ọ dighi umu, ọ dighi kwa umu umu, ọ gēnwe n'etiti ndi-ya, Ọ dighi kwa onye fọduru n'ọnọdu-ọbìa-ya nile.


Àgējikọta Gi na oche-eze nke ihe-ila-n'iyì nile, Nke nēji ukpuru kpuzí nmeb͕u?


N'ihi na ndi-ọzùzù-aturu aghọwo anu-ọhia, ma Jehova ka ha nājughi ase: n'ihi nka ha enweghi uche, aturu nile ha nāzù we b͕asa.


Ọbuná n'ala nka ka i gēsi pua, aka-gi abua adi kwa n'isi-gi: n'ihi na Jehova ajuwo ihe-ntukwasi-obi-gi nile, ọ gaghi-aga-kwa-ra gi nke-ọma nime ha.


si, Nuru okwu Jehova, gi eze Juda, onye nānọkwasi n'oche-eze Devid, gi onwe-gi, na ndi-orù-gi, na ndi-gi ndi nābata n'ọnu-uzọ-ama ndia.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iji nmehie Shemaia onye-Nehelamait leta ya, leta kwa nkpuru-ya; ọ gaghi-enwe nwoke ọ bula nēbi n'etiti ndi nka, ọ gaghi-elekwasi kwa ezi ihe ahu anya, bú nke Mu onwem nēmere ndim, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na okwu nwezuga ka o kwuworo megide Jehova.


N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim, bú eze Juda, si: Ọ gaghi-enwe onye ganānọkwasi n'oche-eze Devid: ọzọ, ozu-ya gābu ihe etufuworo nye ọkpukpọ-nku n'ehihie, nye kwa ọtutu-oyi n'abali.


Eze Babilon we b͕ue umu-ndikom Zedekaia n'anya-ya, ọ bu kwa ndi-isi nile nke Juda ka o b͕uru na Ribla.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan