Jeremaya 22:27 - Bible Nso27 Ma n'ala ahu nke ha onwe-ha nātukwasi nkpuru-obi-ha, si na ha gālaghachi n'ebe ahu, n'ebe ahu ka ha nagaghi-alaghachi. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a27 Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.” Faic an caibideil |
N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.