Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 22:24 - Bible Nso

24 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ buru si na Konaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, bu nb͕a-aka-akàrà n'aka-nrim, ma ọbuná n'ebe ahu ka M'gādọpu gi;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 “Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 22:24
16 Iomraidhean Croise  

Jehoiakin, bú eze Juda, we pukuru eze Babilon, ya onwe-ya, na nne-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-onozi-ya: eze Babilon we jide ya n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze.


O me-kwa-ra ka Jehoiakin je biri na Babilon; nne eze, na ndinyom eze, na ndi-onozi-ya, na ndi-dike nke ala ahu, ndia ka ọ mere ka ha si na Jerusalem je na Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.


Umu-ndikom Jehoiakim kwa: Jekonaia nwa-ya, Zedekaia nwa-ya.


Jehoiakin b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze: o we buru eze ọnwa atọ na ubọchi iri nime Jerusalem: o me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


Tukwasim dika nb͕a-aka-akàrà n'obi-gi dika nb͕a-aka-akàrà n'ogwe-aka-gi: N'ihi na ihu-n'anya di ike dika ọnwu; Ekworo siri ike dika ala-mọ: Nnwupu-ya nile bu nnwupu nke ọku, Ire-ọku nke Ja onwe-ya.


Le, n'ọbu-akam abua ka M'kàworo gi àkà; mb͕idi-gi nile di n'irum mb͕e nile.


Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n'ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu.


Ọ̀ bu ite elelìri elelì nke etipiara etipia ka nwoke a, bú Konaia, bu? ọ̀ bu ihe nke nādighi-atọ utọ? gini mere eji tufu ha-ri, ya onye-ya na nkpuru-ya, tukwasi ha n'ala nke ha nāmaghi?


N'ihi na ihe di otú a ka Jehova kwuru bayere ulo eze Juda, si: Gilead ka i burum, bú isi Lebanon: ma aghaghm ime gi ka i ghọ ọzara, na obodo nke madu nēbighi.


Jehova we me ka m'hu, ma, le, nkata fig abua adọbara n'iru ulo uku nke Jehova; mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, mesiri ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi-isi Juda, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ, we me ka ha biarue Babilon.


ọzọ, Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi Juda nile emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi bàworo na Babilon, ndia ka Mu onwem gaje ime ka ha lata n'ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na M'gab͕aji yoke nke eze Babilon.


(mb͕e Jekonaia, bú eze, na eze-nwanyi, na ndi-onozi, na ndi-isi Juda na Jerusalem, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, pusiri na Jerusalem;)


Zedekaia nwa Josaia we ghọ eze n'ọnọdu Konaia nwa Jehoiakim, onye Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka ọ buru eze n'ala Juda.


N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka M'gēwere gi, Zerubabel nwa Shealtiel, bú orùm, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me gi ka i di ka nb͕a-aka-akàrà: n'ihi na gi ka M'rọputaworo; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan