Jeremaya 22:17 - Bible Nso17 Ma anya-gi abua na obi-gi adighi n'ihe ọ bula ma-ọbughi nání n'urù nēzighi ezi gi, na n'iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, na n'imeb͕u emeb͕u, na n'izọpia-azọpia, ime ya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a17 Ma anya unu na obi unu adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.” Faic an caibideil |
Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n'isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri: