Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 22:14 - Bible Nso

14 onye nāsi, M'gēwuru onwem ulo uku na ime-ulo-elu di iche iche sara mbara, onye nēmere onwe-ya ka window-ya sa mbara; eji kwa osisi cedar machita elu-ya, eji kwa ihe-otite nācha uhie uhie te ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu, nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’ Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ, jirikwa osisi sida machie elu ya, werekwa penti na-acha uhie uhie chọọ ya mma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 22:14
13 Iomraidhean Croise  

na eze siri Netan, bú onye-amuma, Biko, le, Mu onwem nēbi n'ulo cedar, ma ib͕e Chineke nēbi n'etiti ákwà-nkwuba.


O were kwa osisi fir kpuchie ulo ahu nke di kari uku, o we were ezi ọla-edo kpuchie ya, tua akika nkwu na iyab͕a n'elu ya.


Onye nāhu njehie n'anya nāhu ilu-ọ̀gù n'anya: Onye nēme ka ọnu-uzọ-ya di elu nāchọ ntipia.


Dozie ije-ozi-gi n'èzí, Jikere-kwa-ra ya onwe-gi n'ọhia; Emesia wu kwa ulo-gi.


Ntuhie nile nke ulo-ayi nile bu cedar, Age-ulo-ayi nile bu asisi fir.


Ndi ahu gāma kwa, ha nile, bú Efraim na onye bi na Sameria, ndi nēkwu okwu nime npako na n'oké obi, si,


O we tukwasi ihe n'ikwa-iko-ya; o we hu ndikom akàrari na mb͕idi, bú onyinyo ndi Kaldea eji ihe-otite nācha uhie uhie kà,


Eze zara, si, Ọ̀ bughi nka bu Babilon uku a, nke mu onwem wuworo ibu ulo ala-eze, site n'ike nke àkùm na n'ihi ebube nke ima-nmam?


Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo Onwe-ya ṅua iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta), si: Mu onwem nākpọ npako Jekob ihe-árú, ọ bu kwa ulo-elu-ya nile ka M'kpọworo asì: M'gēmechibido kwa obodo na ùjú-ya nye n'aka onye-iro.


Ọ̀ bu oge unu nwere, unu onwe-unu, ibi n'ulo-unu amachitara osisi, mb͕e ulo a bu nkpọnkpọ ebe?


Ọ bu ezie na Edom nāsi, Etituwo ayi, ma ayi gēwughachi nkpọnkpọ ebe nile; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ndi ahu gēwu, ma Mu onwem gākwatu: agākpọ kwa ha Ókè-ala nmebi-iwu, na Ndi ahu nke Jehova wesaworo oké iwe rue mḅe ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan