Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 21:4 - Bible Nso

4 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'ganēchighari ihe agha nile nke di n'aka-unu, nke unu onwe-unu ji ebuso eze Babilon na ndi Kaldea agha, bú ndi nānọchigide unu n'agha n'azu mb͕idi obodo, M'gāchikọta kwa ha n'etiti obodo a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 21:4
23 Iomraidhean Croise  

Ọ bu nání na ọ makpuworo n'ọnọdu onye-nkpọrọ, ọ bu kwa n'ọnọdu ndi eb͕uru eb͕u ka ha gāda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Nuru olu ìgwè n'ugwu nile, yiri nke ndi bara uba! nuru olu nkpotu ala-eze nile nke mba nile achikọtaworo! Jehova nke usu nile nke ndi-agha nāgukọta usu-ndi-agha ibu agha.


Ma ub͕u a, biko, ka m'me ka unu mara ihe mu onwem gaje ime ubi-vine nkem: m'gēwezuga ogige-ya, o we ghọ ebe anu-ulo nāta nri; m'gētipia mb͕idi-ya, o we ghọ ebe anāzọtọ:


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje ime gi ka i ghọrọ onwe-gi, ghọ-kwa-ra ndi nile nāhu gi n'anya, ihe-ujọ: ha gāda kwa site na mma-agha ndi-iro-ha, anya-gi abua ganāhu kwa ya: ọ bu kwa Juda nile ka M'gēnye n'aka eze Babilon, ọ gēme kwa ka ha je biri na Babilon, ọ gēji kwa mma-agha tib͕ue ha.


Jeremaia we si ha, Otú a ka unu gāsi Zedekaia:


Le, obo-ihe ndia atuliri atuli, ha abiaruwo obodo a iwere ya; enyewo kwa obodo a n'aka ndi Kaldea ndi nēbuso ya agha, n'ihi mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe: ihe I kwuworo erèwo kwa; ma, le, I nāhu ya.


N'ihi na Zedekaia, bú eze Juda, b͕ochibidoro ya-ri, si, Gini mere gi onwe-gi ji ebu amuma, si, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje inye obodo a n'aka eze Babilon, ọ gēwere kwa ya;


ọ bu kwa Babilon ka ọ gēme ka Zedekaia jerue, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gānọ rue mb͕e M'gēleta ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): mb͕e unu gēbuso ndi Kaldea agha, ọ gaghi-agara unu nke-ọma?


Ha nābia ibuso ndi Kaldea agha, na imeju ha n'ozu madu ndi M'tib͕uworo n'iwem na n'ọnumam, ndi M'zonariwo-kwa-ra obodo a irum n'ihi ihe ọjọ nile ha.


n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ ahu nile biakute Juda, biakute kwa ndi nile bi na Jerusalem, bú nke M'kwuworo megide ha: n'ihi na agwawom ha okwu, ma ha anughi; M'we kpọ ha òkù, ma ha azaghi.


na ndi-isi nile nke eze Babilon batara, we nọdu n'ọnu-uzọ-ama nke etiti, bú Neagal-shareza, na Samga-nebo, na Sasekim, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon fọduru.


Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.


O bipuwo mpi nile ọ bula nke Israel n'iwe di ọku; O seghachiwo aka-nri-Ya azu site n'iru onye-iro: O rechapuwo kwa Jekob dika ọku nēnwu enwu, nke nēripia buruburu.


Onye-nwe-ayi adiwo ka onye-iro, Ọ lodawo Israel; O lodawo ulo-elu-ya nile, O bibiwo ebe-Ya nile ewusiri ike: O me ka ize-ume na isu-ude ba uba n'ada Juda.


Onye-nwe-ayi ajusiwo ebe-ichu-àjà-Ya, Ọ sọwo ebe nsọ Ya oyi, O mechibidowo mb͕idi nile nke ulo-elu-ya nile nye n'aka onye-iro: Ha emewo ka olu-ha da udà n'ulo Jehova, dika n'ubọchi nke mb͕e akara àkà.


M'gētipu kwa uta-gi n'aka-ekpe-gi, me ka àkú-gi nile dapu n'aka-nri-gi.


E, ọ buru na ha azulite umu-ha, ma M'gāb͕aba ha aka nwa, madu ọ bula ewe ghara idi: e, ahuhu di-kwa-ra ha mb͕e M'gēsi n'aru ha wezuga Onwem!


M'gāchikọta kwa mba nile ibuso Jerusalem agha; agēwere kwa obodo a, punara ya ulo-ya nile, merua ndinyom-ya: nkera obodo a gāpu buru ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma agaghi-ebipu ndi nka fọduru n'obodo a.


Ma eze ahu were iwe; o we ziga usu-ndi-agha-ya nile, la ndi-ob͕u-madu ahu n'iyì, rechapu kwa obodo-ha ọku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan