Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 21:1 - Bible Nso

1 Okwu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e eze, bú Zedekaia, zigara ya Pashua nwa Malkija, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, si,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya ntị mgbe eze Zedekaya zigara Pashua nwa Malkija, na onye nchụaja bụ Zefanaya nwa Maaseia,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 21:1
20 Iomraidhean Croise  

Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi nkem, ju-kwa-ra Juda nile, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n'ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke amuyeworo dika ọku megide ayi, n'ihi na nna-ayi-hà egeghi okwu nile nke akwukwọ a nti, ime dika ihe si di nke edeworo n'ihi ayi.


Umu-ndikom Josaia kwa; ọkpara-ya Johanan, nke-abua Jehoiakim, nke-atọ Zedekaia, nke-anọ Shalum.


na Adaia nwa Jeroham, nwa Pashhua, nwa Malkija, na Maasai nwa Adiel, nwa Jahzera, nwa Meshulam, nwa Meshilemit, nwa Imea;


O we me ka eze Kaldea rigokwasi ha, o we were mma-agha b͕ue umu-okorọbia-ha n'ulo ebe nsọ ha, o nweghi kwa ọmiko n'aru nwa-okorọbia, ma ọbu n'aru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ma-ọbu n'aru okenye, ma-ọbu n'aru onye kara nká: ha nile ka O nyere n'aka-ya.


na umu-nne-ha ndi nēje ozi ulo ahu, nnù abua na orú na abua: na Adaia nwa Jeroham, nwa Pelalia, nwa Amzi, nwa Zekaraia, nwa Pashua, nwa Malkija,


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si, N'ihi na gi onwe-gi ezigaworo ndi nka nile ndi bi na Jerusalem, ziga-kwa-ra Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà nile, akwukwọ n'aha-gi, si,


Zefanaia, bú onye-nchu-àjà, we gua akwukwọ a na nti Jeremaia, bú onye-amuma.


m'we me ka ha bata n'ulo Jehova, n'ime-ulo umu Henan nwa Igdalaia, bú onye nke Chineke, nke di n'akuku ime-ulo ndi-isi, nke di n'elu ime-ulo Maaseia nwa Shalum, bú onye-nche nke nbata-uzọ:


Zedekaia nwa Josaia we ghọ eze n'ọnọdu Konaia nwa Jehoiakim, onye Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka ọ buru eze n'ala Juda.


eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n'ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N'aka eze Babilon ka agēnye gi.


Zedekaia, bú eze, we zìe Jehukal nwa Shelemaia, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, jekuru Jereamia, bú onye-amuma, si, Biko, kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere.


Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi eze Juda, onye zìworo unu biakutem ijum ase; Le, usu-ndi-agha Fero, nke putaworo iyere unu aka, gālaghachi n'ala-ya, bú Ijipt.


Shefataia nwa Matan, na Gedalaia nwa Pashua, na Jukal nwa Shelemaia, na Pashua nwa Malkija, we nuru okwu nile nke Jeremaia nāgwa ndi Israel nile, si,


Eze, bú Zedekaia, we ziga, kutara onwe-ya Jeremaia, bú onye-amuma, rue nbata nke-atọ nke di n'ulo Jehova: eze we si Jeremaia, Mu onwem gaje iju gi otù ihe; ezonarilam ihe ọ bula.


Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan