Jeremaya 20:9 - Bible Nso9 M'we si, M'gaghi-ehota Ya, m'gaghi-ekwu kwa okwu ọzọ n'aha-Ya. O we di n'obim dika ọku nēre ere nke emechibidoro n'ọkpukpum nile, ike gwu-kwa-ram inagide ya, enweghkwam ike. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a9 Ọ bụrụkwa na m ekwuo nʼobi m sị, “Agaghị m ekwute ihe ọbụla metụtara okwu ya maọbụ aha ya ọzọ.” Ọ dịghị ekwe m. Nʼihi na okwu ya na-enwu m ọkụ nʼobi. Ọ dịkwa ka ọkụ na-enwu enwu emechibidoro ụzọ nʼime ọkpụkpụ m. Ike agwụla m ịnagide okpomọkụ nke okwu ya. Nʼezie, apụghịkwa m ịnagide ya. Faic an caibideil |