Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 20:18 - Bible Nso

18 N'ìhi gini kwa ka m'siri n'afọ nnem puta ihu ọnọdu ọjọ na nwuta, ewe ji ihere me ka ubọchim nile gwusia?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Nʼihi gịnị ka m ji site nʼafọ nne m pụta ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị a, na ịnọgide nʼobi mwute, na ịnọ ọnọdụ ihere ogologo ụbọchị niile nke ndụ m?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 20:18
27 Iomraidhean Croise  

Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n'ọzara, bia nọdu n'okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n'ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà.


Madu nke nwayi muru, Ubọchi-ndu-ya di nkpunkpu, afọ ejuwo kwa ya n'ahuhu.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I zobem n'ala-mọ, Ma asi na I debem na nzuzo, rue mb͕e iwe-Gi laghachiri, Ma asi na I kparam ókè, we chetam!


N'ìhi gini ka O nēnye onye nọ n'ọnọdu ọjọ ìhè? N'ìhi gini kwa ka O nēnye ndi nkpuru-obi-ha di ilu ndu?


Kama anāmuputa madu nye ọnọdu ọjọ, Dika icheke-ọku nile nēfeli elu.


N'ihi na ubọchim nile agwusiwo n'anwuru-ọku, Erechapuwo kwa ọkpukpum nile dika ọlọkọ-ọku.


Gi onwe-gi amawo ita-utam, na iherem, na ọnọdu-iherem: N'iru Gi ka ndi-nkpab͕um nile nọ.


Site n'ọbu-ukwu we rue isi ọ dighi izu-okè di nime ya; kama ob͕ub͕u-mma, na itiru-aru, na ọnyá etiputara ọhu: apikọtaghi ha, ekechighi kwa ha, ejighi kwa manu me ka ha di nrò.


Genum nti, unu ndi mara ezi omume, bú ndi ahu nke iwum di n'obi-ha; unu atula egwu ita-uta madu, unu atu-kwa-la ujọ nkwulu nile ha.


Ahuhu dirim, nnem, na i muwom onye-ọ̀gù na onye-esem-okwu n'ebe uwa nile di! ebinyeghm ego n'uma; madu ebinyeghkwam ego n'uma; ma onye ọ bula nime ha nākọcham.


N'ìhi gini ka ihe-nb͕um digidere mb͕e nile? n'ìhi gini ka ntiputa-ọnyám nādighi ngwọta? ọ juwo ka agwọta ya. Ì gāburum nání ihe di ka miri-iyi nārafu arafu, dika miri na-ekwesighi ntukwasi-obi?


Ka ayi dina ala n'ihere-ayi, ka ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya kpuchi kwa ayi: n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi mehieworo megide, ayi onwe-ayi na nna-ayi-hà, site na mb͕e ayi di na nwata we rue ta: ayi egeghi kwa nti n'olu Jehova, bú Chineke-ayi.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na agamab͕asa irum megide unu taa! n'arum ka aru nādighi obim ike.


Ọ̀ bughi unu ihe, unu nile ndi nāgabiga n'uzọ? Legidenu, hu ma ọ di ihe-nb͕u dika ihe-nb͕um di, bú nke anēme mu, Onye Jehova mekpaworo aru n'ubọchi iwe-Ya di ọku.


Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n'ala site na nkpa-n'aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.


N'ìhi gini ka I nēme ka m'hu ajọ ihe? n'ìhi gini ka I nēlegide nmeb͕u? ma ipunara-madu-ihe ma ihe-ike di n'irum: ilu-ọ̀gù we di, esem-okwu nēbuli kwa onwe-ya.


N'ezie, n'ezie, asim unu, na unu onwe-unu gēti nkpu ákwá, kwa kwa ákwá, ma uwa gāṅuri ọṅu: ọ gēwuta unu onwe-unu, ma nwuta-unu gāghọ ọṅù.


Ya mere ha siri n'iru nnọkọ-ikpé ahu la, nāṅuri na aguru ha na ndi kwesiri ka eme ha ihe-ihere n'ihi Aha ahu.


Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n'ihi na amataram Onye m'kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m'kweye na Ọ puru iche ihe m'nyere n'aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu.


N'ihi na ntachi-obi di unu nkpà, ka ọ gābu, mb͕e unu meworo ihe Chineke nāchọ, ka unu we nata nkwa ahu.


ma ndi ọzọ ka anwara ọnwunwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke ab͕u na ulo-nkpọrọ:


nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke.


Ya mere, ka ayi pukuru Ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, nēbu ita-uta-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan