Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 2:28 - Bible Nso

28 Ma òle ebe chi-gi nile nke i meworo nye onwe-gi nọ? ka ha bilie, ọ buru na ha gāzọputa gi na mb͕e ọnọdu ọjọ gi: n'ihi na dika ọnu-ọgugu obodo-gi nile si di, otú a ka chi-gi nile di, Juda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Olee ebe chi ndị ahụ i meere nye onwe gị nọ? Ka ha bịa, ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịzọpụta gị, mgbe nsogbu bịakwasịrị unu. Nʼihi na gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dịka i si nwee ọtụtụ obodo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 2:28
16 Iomraidhean Croise  

Elaisha we si eze Israel, Gini ka mu na gi nwekọrọ? jekuru ndi-amuma nna-gi, jekuru kwa ndi-amuma nne-gi. Eze Israel we si ya, É-è: n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab.


Chikọtanu onwe-unu, bia; biarunu nso n'otù, unu ndi mba nile b͕aputara ab͕aputa: ha amaghi ama, bú ndi ahu nēbu osisi arusi-ha apiri api, ndi nēkpe-kwa-ra chi nādighi-azọputa.


Ha amakpuwo, ruru ala n'otù; ha apughi ime ka ibu wezuga onwe-ya, kama ha onwe-ha alawo na ndọta-agha.


Ha nēbuli ya n'ubu, n'ebu ya, we dọba ya n'ọnọdu-ya, o we guzo; ọ gaghi-esi n'ebe-ya pua: e, madu gētiku ya nkpu, ma ọ gaghi-aza, ọ gaghi-azọputa ya n'ahuhu-ya.


Mb͕e i nēti nkpu, ka ndi i chikọtaworo naputa gi; ma ha nile ka ifufe gēfepu, otù nku-ume gēkupu ha: ma onye ahu nke nab͕abà nimem gēketa ala, nweta kwa ugwu nsọm.


M'gēkwu kwa okwu ikpem nile n'ebe ha nọ bayere ihe ọjọ ha nile; n'ihi na ha arapuwom, we surere chi ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, kpọ kwa isi ala nye ọlu di iche iche nke aka-ha.


Obodo nile nke Juda na ndi bi na Jerusalem gēje kwa tikuru chi nile nke ha onwe-ha nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: ma ọ dighi nzọputa ma-ọli ha gāzọputa ha na mb͕e ihe ọjọ ha.


N'ihi na ka ọnu-ọgugu obodo-gi ra, otú a ka chi-gi nile di, gi Juda; ka ọnu-ọgugu èzí Jerusalem ra kwa, otú a ka unu doworo ebe-ichu-àjà nye ihe-ihere ahu, bú ebe-ichu-àjà isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Éwù! n'ihi na ub͕ochi ahu di uku, ọ dighi kwa ubọchi nke di ka ya: ọbuná mb͕e ahuhu ka ọ buru Jekob; ma agēsi nime ya zọputa ya.


Òle ebe kwa ka ndi-amuma-unu nọ, bú ndi buru unu amuma, si, Eze Babilon agaghi-abia imegide unu, ma-ọbu imegide ala nka?


Osisi vine nke nēkosa ekosa ka Israel bu, nkpuru ka ọ nāmiziri onwe-ya: ọ bu dika iba-uba nke nkpuru-ya si di ka o mere ka ebe-ichu-àjà-ya ba uba; ọ bu dika ọdi-nma nke diri ala-ya si di ka ha mere ka ogidi nile di nma.


Ùrù gini ka arusi apiri api bara, na onye nēme ya apiwo ya? ùrù gini ka arusi awuru awu na onye-ozízí okwu-ugha bara, na onye nākpu ihe-ya akpuru akpu atukwasiwo ya obi, ime arusi dara ob͕i di iche iche?


Ahuhu diri onye nāsi osisi, Teta; nke nāsi nkume dara ob͕i, Kpọte onwe-gi! Nka, ò gēzí ihe? Le, ihe a bu ihe eji ọla-edo na ọla-ọcha machita, ọ dighi kwa mọ ọ bula di nime ya.


Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ? Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya;


Jenu, tikue chi ndi unu rọputaworo; ka ha onwe-ha zọputa unu na mb͕e nkpab͕u-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan