Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 2:27 - Bible Nso

27 ndi nāsi osisi, Nnam ka i bu; nāsi kwa nkume, Gi onwe-gi murum: n'ihi na ha ab͕akutawom azu, ha echeghm iru: ma na mb͕e ọnọdu ọjọ ha ha gasi, Bilie, we zọputa ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ha na-asị osisi, ‘Nna m ka ị bụ,’ na-asịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’ Ha agbakụtala m azụ, jụ iche m ihu. Ma mgbe ọbụla nsogbu bịakwasịrị ha, ha na-asị, ‘Bịa, zọpụta anyị.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 2:27
23 Iomraidhean Croise  

N'ihi na nna-ayi-hà mekpuru emekpu, me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ayi, ha we rapu Ya, si n'ebe-obibi Jehova chigharia iru-ha, b͕akuta azu-ha.


Jehova, n'ahuhu ka ha letaworo Gi, ha takwuru ntakwu n'ekpere nke-uku mb͕e idọ-aka-na-nti-Gi ruru ha aru.


Ma ha nile n'otù bu anu-ọhia na ndi-nzuzu: idọ-aka-na-nti nke ihe-efu, nání osisi ka ọ bu.


Dika ifufe Iru-anyanwu ka M'gāchusa ha n'iru onye-iro; azu, ọ bughi iru, ka M'gēme ka hu ha n'ubọchi nhuju-anya-ha.


i bu nne-inyinya-ibu-ọhia nke mara ọzara aka; n'ọchichọ nke nkpuru-obi-ya o kubawo ifufe; na mb͕e ọbub͕a-ya ònye gēme ka ọ laghachi azu? ndi nile nke nāchọ ya agaghi-ada #mbà; n'ọnwa-ya ka ha gāchọta ya.


Gi nwanyi nēbi na Lebanon, nke nālu akwu-gi n'etiti osisi cedar nile, le, ka i si buru onye agēmere amara nke-uku mb͕e ihe-nb͕u nābiakwasi gi, nb͕ali dika nke nwanyi ime nēme!


O rue, site n'idi-nfe nke ikwa-iko-ya, na emeruru ala-ya, ọ we kwaso nkume, kwaso kwa osisi, iko.


Éwù! n'ihi na ub͕ochi ahu di uku, ọ dighi kwa ubọchi nke di ka ya: ọbuná mb͕e ahuhu ka ọ buru Jekob; ma agēsi nime ya zọputa ya.


Ha we b͕akutam azu, ha echeghm iru: anameme kwa ka ha muta ihe, nēbili n'isi-ututu nēme ka ha muta, ma ha adighi-anu inara idọ́-aka-na-nti.


Zedekaia, bú eze, we zìe Jehukal nwa Shelemaia, na Zefanaia nwa Maaseia, bú onye-nchu-àjà, jekuru Jereamia, bú onye-amuma, si, Biko, kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere.


si Jeremaia, bú onye-amuma, Biko, ka aririọ-amara-ayi da n'iru gi, gi kpere ayi Jehova, bú Chineke-gi, ekpere, kpe ekpere bayere ndia nile fọduru; n'ihi na ayi fọduru nànì madu ole-na-ole si n'ọtutu madu puta, dika anya-gi abua si ahu ayi:


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i chezọwom, tufuem n'azu-gi, n'ihi nka gi onwe-gi būru kwa ajọ ihe-nzube-gi na ikwa-iko-gi nile.


O we me ka m'ba nime ogige di nime nke ulo Jehova, ma, le, n'ọnu-uzọ ulo uku nke Jehova, n'etiti uzọ-nbata na ebe-ichu-àjà, ka ihe ra ka orú ndikom na ise nọ, b͕akuta ulo uku nke Jehova azu-ha, che iru-ha n'akuku Iru-anyanwu; ndi ahu nākpọ kwa isi ala nye anyanwu che Iru-anyanwu iru.


Onye-nwe-ayi, Gi ka ezi omume diri, ma ayi ka ihere iru diri, dika o si di ta; ọ diri ndi Juda, di-kwa-ra ndi bi na Jerusalem, di-kwa-ra Israel nile, ma ndi nọ nso, ma ndi nọ n'ebe di anya, n'ala nile ebe I chugaworo ha, n'ihi nmekpu-ha nke ha mekpuru Gi.


Ndim nāju ase n'aka osisi-ha, nkpa-n'aka-ha nēgosi kwa ha ihe: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile emewo ka ha kpafue, ha we pua n'okpuru Chineke-ha kwa iko.


M'gāla, lata n'ọnọdum, rue mb͕e ikpe gāma ha, ha we chọ irum: n'ahuhu-ha ka ha gāchọsim ike.


Ha ejighi kwa obi-ha tikuem, kama ha nākwasi ákwá ike n'elu ihe-ndina-ha: n'ihi ọka na manya-vine ọhu ka ha nāchikọta onwe-ha, ha nēwezuga onwe-ha imegidem.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan