Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 2:24 - Bible Nso

24 i bu nne-inyinya-ibu-ọhia nke mara ọzara aka; n'ọchichọ nke nkpuru-obi-ya o kubawo ifufe; na mb͕e ọbub͕a-ya ònye gēme ka ọ laghachi azu? ndi nile nke nāchọ ya agaghi-ada #mbà; n'ọnwa-ya ka ha gāchọta ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Nne ịnyịnya ibu ọhịa nke mara ụzọ ya nke ọma nʼọzara, na-esi imi ma ọ ga-esichapụta oke ịnyịnya ibu, onye pụrụ igbochi ya nʼoge mmekọ ya na oke ịnyịnya zuru? Oke ịnyịnya ọbụla chọọrọ ya agaghị atụfu oge nʼịchụgharị ya, nʼihi nʼoge ha chọrọ mmekọ, ha ga-achọta ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 2:24
8 Iomraidhean Croise  

Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi, Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu.


Ì nāgu ọnwa ha nọzuru n'imu nwa ọnu? Ma-ọbu ì mawo mb͕e ha ji amu nwa?


Inyinya-ibu-ọhia eguzowo kwa n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, ha ekubawo ifufe dika nkita-ọhia; anya-ha adalawo n'isi, n'ihi na ihe-ọkukú adighi.


ndi nāsi osisi, Nnam ka i bu; nāsi kwa nkume, Gi onwe-gi murum: n'ihi na ha ab͕akutawom azu, ha echeghm iru: ma na mb͕e ọnọdu ọjọ ha ha gasi, Bilie, we zọputa ayi.


Ndinyom nile nke nākwa iko ka ha nēnye onyinye: ma gi onwe-gi enyewo ndikom nile nāhu gi n'anya onyinye-gi nile, i we go ha ngo, ka ha si n'ebe nile di buruburu biakute gi n'ihi ikwa-iko-gi nile.


M'gāla, lata n'ọnọdum, rue mb͕e ikpe gāma ha, ha we chọ irum: n'ahuhu-ha ka ha gāchọsim ike.


N'ihi na ha onwe-ha arigowo n'Asiria, dika inyinya-ibu-ọhia nke nání ya nọ iche: Efraim egowo ndi nāhu ya nānya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan