Jeremaya 2:15 - Bible Nso15 Ya ka umu-ọdum nāb͕o uja, ha ewewo ka olu-ha da udà: ha we me ka ala-ya ghọ ebe tọbọrọ n'efu; esuresiwo obodo-ya nile oku, ha we ghara inwe onye-obibi. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a15 Ọdụm agbọọla ụja, ha ebigbọọla meekwa ka ọ nụ olu ha. Ha ebibiela obodo ya laa ya nʼiyi, suo ya ọkụ, nke mere na o nweghị onye bi na ha. Faic an caibideil |
le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.
Otú a ka Jehova siri: Agānu kwa ọzọ n'ebe a, nke unu onwe-ūnu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, ọbuná n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem, nke bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, nke ọ n'adighi madu, ọ nādighi kwa onye-obibi, ọ nādighi kwa anumanu, nēbi nime ha,