Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 2:10 - Bible Nso

10 N'ihi na, gabiganu rue agwe-etiti nile nke Kitim, we hu; ziga-kwa-nu na Kida, we chigharia uche nke-uku; hu-kwa-nu ma ihe di otù a adiwo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya, zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma, ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 2:10
21 Iomraidhean Croise  

ndia bu kwa aha umu-ndikom Ishmael, n'aha-ha, dika osuso-ọmumu-ha si di: ọkpara Ishmael, Nebaiot; na Kida, na Adbeel, na Mibsam,


Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke-ha, Onye mere ka ndi bu nna-ha si n'ala Ijipt puta, ha we jide chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha, fè ha òfùfè: n'ihi ya ka Jehova meworo ka ihe ọjọ a nile biakwasi ha.


Umu-ndikom Jevan kwa; Elaisha, na Tashish, na Kitim, na Rodanim.


Ma Devid ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya ju-kwa-ra ya afọ, o we me Solomon, bú nwa-ya, eze Israel.


Umu-ndikom Kohat; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel, anọ.


Ahuhu dirim, na anọm dika ọbìa nime Meshek, Na ebim n'akuku ulo-ikwū nile nke Kida!


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Tutu otù arọ agwu, dika arọ onye egoro ọlu si di, nsọpuru nile nke Kida gāgwusi:


Ibu eboro Taia. Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish; n'ihi na ebibiwo ya, ulo we ghara idi ya, uzọ-nbata ghara kwa idi ya: esiwo n'ala Kitim kpughere ha ya.


O we si, I gaghi-aṅuri kwa Ọṅu-agha ọzọ, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke anēmeb͕u, bú ada Zaidon: bilie, gabiga rue Kitim; ọbuná n'ebe ahu ọ dighi izu-ike i gēnwe.


Nke diri Kida, di-kwa-ra ala-eze nile nke Hezoa, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru. Otú a ka Jehova siri: Bilienu, rigorue Kida, punara umu Iru-anyanwu ihe-ha.


I we chiri uwe-gi ufọdu, mere onwe-gi ebe di iche iche di elu nke aturu agwa, i we kwa iko n'elu ha: ihe di otú a ekwesighi ibia, ọ gaghi-adi kwa otú a.


Arebia na ndi-isi nile nke Kida, ndi ahu bu ndi-ahia nke aka-gi; n'umu-aturu na ebulu na ewu, n'ihe ndia ka ha bu ndi-ahia-gi.


Osisi oak nke si na Beshan aputa ka ha jiworo me umara-gi nile; oche-umara-gi ka ha jiworo ọdu, ekwukọyere n'osisi igbe nke si n'agwe-etiti Kitim aputa, me.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, ji si otú a: N'ihi na unu nātu ùzù kari mba nile nke di unu buruburu, unu we ghara ijeghari n'ukpurum nile, ghara kwa ime ihe nile M'kpere n'ikpe, ọ bughi kwa dika ikpé nile nke mba nile nke di unu buruburu si di ka unu meworo;


Ọ gēchighari kwa iru-ya le agwe-etiti nile, were ọtutu: ma otù ọchi-agha gēme ka ita-uta-ya kwusiri ya; e, ọ gēme kwa ka ita-uta-ya laghachikute ya.


Ma ub͕ọ Kitim gābia imegide ya; obi-ya ewe mebie emebi, o we laghachi, wesa ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu oké iwe, me ihe, laghachi, tugharia uche na ndi nārapu ọb͕ub͕a-ndu nsọ ahu.


Ma ub͕ọ ufọdu gēsi n'akuku Kitim bia, Ha gēweda kwa Asiria n'ala, weda kwa Iba n'ala, Ọzọ kwa, ya onwe-ya gābiaru ila-n'iyì.


Anānu nọ̄ na ikwa-iko di n'etiti unu, aha ikwa-iko nke nādighi kwa ọbuná n'etiti ndi mba ọzọ, nke mere na otú onye n'etiti unu nwere nwunye nna-ya.


O rue, na onye ọ bula nke nāhu ya anya siri, Ọ dighi mb͕e emere ka ihe di otú a di, ahughi kwa ihe di otú a site n'ubọchi umu Israel siri n'ala Ijipt rigota rue ta: tukwasinu uche na ya, b͕anu ìzù, kwu-kwa-nu okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan