Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 19:8 - Bible Nso

8 M'gēme kwa ka obodo a ghọ ihe-iju-anya, ka ọ ghọ kwa ihe-ima-ọsọ; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Aga m ebibi obodo a mee ka ọ ghọọ ihe iju anya na ihe ịma ọsụ. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 19:8
14 Iomraidhean Croise  

ulo a kwa, nke kachasi elu, o gēju onye ọ bula nke nāgabiga ya anya, ọ gāma ọsọ; ha gāsi kwa, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka na ulo a otú a?


ime ka ala-ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ mb͕e ebighi-ebi; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, o gēfufe kwa isi-ya.


bú Jerusalem, na obodo nile nke Juda, na ndi-eze-ya, na ndi-isi-ya, ime ha nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na ihe-nkọcha; dika o si dì ta;


N'ihi na Onwem ka M'jiri ṅu iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ihe-iju-anya na ihe-ita-uta na nkpọnkpọ ebe na ihe-nkọcha ka Bọzra gāghọ; obodo-ya nile gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe mb͕e ebighi-ebi.


Site n'iwe Jehova madu agaghi-ebi nime ya, ma ọ gābusi ebe tọb͕ọrọ n'efu; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku Babilon anya, ọ gāma ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile.


Ndi-ahia n'etiti ndi nile di iche iche amawo gi ọsọ; oké egwu ka i ghọworo, i gaghi-adi kwa ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Mu onwem gēme kwa ala-unu ka ọ tọb͕ọrọ n'efu: ibobo ya gānwu kwa ndi-iro-unu n'aru, bú ndi di nime ya.


N'ihi na anēdebe ukpuru nile nke Ọmri, na ọlu nile nke ulo Ehab, unu ewe jeghari nime ndum-ọdu nile ha: ka M'we me gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, me kwa ndi bi nime-ya ka ha ghọ ihe-ima-ọsọ; ọ bu kwa ita-uta ndim ka unu gēbu.


Nka bu obodo ahu nke nāṅuri ọṅu-agha, nke nānọ na ntukwasi-obi, nke nāsi n'obi-ya, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem: le otú ọ ghọworo ebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe-nmakpu diri anu-ọhia! onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya gāma ọsọ, fegharia aka-ya.


I gāghọ kwa ihe-iju-anya, na ilu, na ihe-àkùkù, n'etiti ndi ahu nile ebe Jehova gēdu gi je.


Ọb͕ọ ahu nke di n'iru, bú umu-unu ndi gēbili inọchi unu, na onye ala ọzọ nke gēsi n'ala di anya bia, gāsi, mb͕e ha nāhu ihe-otiti nile nke ala ahu, na ọria nile ya, nke Jehova jiworo me ka ọ nāria ọria;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan