Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 19:6 - Bible Nso

6 n'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ebe a Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na ụbọchị ahụ na-abịa, ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe ndị mmadụ agaghị akpọkwa ebe a Tofet ma ọ bụkwanụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom, kama a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Ogbugbu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 19:6
5 Iomraidhean Croise  

N'ihi na edowo otù Tofet n'usoro site na mb͕e gara aga; e, nke ahu ka edoziworo nye eze; O mewo ya ka ọ di omimi, me ya ka ọ sa mbara: obo-ya bu ọku na ọtutu nkú; nku-ume Jehova, dika iyi brimstone, nāfunwu ya.


i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọbuna otú a ka M'gētiwa ndi nka na obodo a, dika madu si etiwa ite ọkpu-ite, nke anāpughi imezi kwa ya ọzọ: ọ bu kwa na Tofet ka ha gēlì ozu, n'ihi na ebe ilì ozu adighi.


purue ndagwurugwu nwa Hinom, nke di n'oghere ọnu-uzọ-ama ejùjù, kpọsa n'ebe ahu okwu nile nke M'gāgwa gi:


ókè-ala ahu we rigo na ndagwurugwu nwa Hinom rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida (ndida ahu bu Jerusalem): ókè-ala ahu we rigo rue elu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu Hinom n'akuku Ọdida-anyanwu, nke di na nsọtu ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan