Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 19:15 - Bible Nso

15 Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ a nile biakwasi obodo a, biakwasi kwa obodo-ya nile, bú nke M'kwuworo megide ya; n'ihi na ha ekwesiwo olu-ha ike, ka ha ghara inu okwum nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 “Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke nke Izrel sịrị, ‘Geenụ ntị! Ana m aga ime ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru okwu ya bịakwasị obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, nʼihi na ha bụ ndị isiike, ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 19:15
23 Iomraidhean Croise  

ha we ju inu ihe, ha echetaghi kwa oké ọlu-Gi nile nke I luru n'etiti ha; ha we kwesie olu-ha ike, do onye-isi nime nnupu-isi-ha ilaghachi n'ọbubu-orù-ha: ma Gi onwe-gi bu Chineke nke nb͕aghara nmehie, Onye nēme amara nwe kwa obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere, I rapughi kwa ha.


I we b͕a àmà megide ha, ime ka ha lata n'iwu-Gi: ma ndi ahu mere ihe na nganga, ha egeghi kwa nti ihe nile I nyere n'iwu, kama ha mehiere megide ikpé-Gi nile, (nke madu nēme nādi kwa ndu nime ha,) ha we wezuga ubu-ha, kwesie olu-ha ike, ha anughi kwa.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ, nke ha nāpughi isi nime ya puta, biakute ha; ha gētikukwam, ma M'gaghi-ege ha nti.


N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye ahu nke kuworo gi n'ala, ekwuwo ihe ọjọ megide gi, n'ihi ihe ọjọ nke ulo Israel na ulo Juda, nke ha meworo onwe-ha n'ikpasum iwe n'isurere Beal ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


N'ihi na dika ihe-ọkiké nārapara n'úkwù madu, otú a ka M'meworo ka ulo Israel nile na ulo Juda nile rapara n'arum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ka ha we ghọrọm otù ndi, na aha, na otuto, na ima-nma: ma ha anughi.


ma ha anughi, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we kwesie olu-ha ike, ka ha we ghara inu, ghara kwa inara idọ-aka-na-nti.


Ma ub͕u a, biko, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu onwem nākpu ihe ọjọ megide unu, nēchè kwa èchìchè megide unu: biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me kwa ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma.


si, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na ndi bi na Jerusalem; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.


Agwaram i okwu n'udo-gi; ma i siri, M'gaghi-anu. Nka bu uzọ-gi site na mb͕e i di na nwata, na i geghi nti olum.


Site n'arọ nke-iri-na-atọ nke Josaia nwa Emon, bú eze Juda, we rue ta, orú arọ na ato ndia, ka okwu Jehova ruworom nti, m'we gwa unu, nēbili n'isi-ututu nēkwu; ma unu anughi.


Jehova ezitewo-kwa-ra unu ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha; ma unu anughi, unu atọghi kwa nti-unu n'ala inu;


Ma egeghm nti, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka unu we were ọlu aka-unu kpasuem iwe, ime onwe-unu ihe ọjọ.


N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji si otú a: N'ihi na unu anughi okwum nile,


M'gēji kwa ajọ omume-ha leta ya, leta kwa nkpuru-ya, leta kwa ndi-orù-ya; M'gēme kwa ka ihe ọjọ ahu nile nke M'gwara ha, ma ha anughi, biakwasi ha, biakwasi kwa ndi bi na Jerusalem, biakwasi kwa ndi Juda.


Jehova, ànya-Gi abua adighi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata.


Nuru, gi uwa: le, Mu onwem nēme ka ihe ọjọ biakwasi ndi nka, bú nkpuru nke èchìchè nile ha, n'ihi na okwum nile ka ha nāṅaghi nti; iwum kwa, ha ajuwo ya.


ma ha egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we kwesie olu-ha ike: ha mere ihe ọjọ kari ndi bu nna-ha.


Onye-nwe-ayi elowo ebe-obibi nile nke Jekob, ghara inwe ọmiko n'aru ha; Ọ kwadawo ebe nile ewusiri ike nke ada Juda nime nrubiga-ókè nke iwe-Ya: O tidaruwo ha ala: O mewo ala-eze na ndi-isi-ya ka ha ghara idi nsọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan