Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 18:22 - Bible Nso

22 Ka anuru iti-nkpu nke gēsite n'ulo nile ha, mb͕e I gēme ka usu ndi nāpunara madu ihe biakwasi ha na mberebe: n'ihi na ha egwuwo olùlù inwudem, ha ezobewo-kwa-ra ukwum abua ib͕udu di iche iche.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Mee ka e site nʼụlọ ha nụ mkpu akwa, mgbe i mere ka ndị iro ha buso ha agha na mberede. Nʼihi na ha egwuola olulu ijide m, ha esiekwarala m ọnya nzuzo ijide m nʼụkwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 18:22
23 Iomraidhean Croise  

Ndi-nganga egwuworom olùlù di iche iche, Bú ndi nādighi ka iwu-Gi si di.


Ndi-npako ezobeworom ib͕udu, na udọ̀ di iche iche; Ha ab͕asowo ub͕u n'akuku uzọ; Ọnyà di iche iche ka ha siworom. Selah


Asirim Jehova, Chinekem ka I bu: Ṅa nti olu aririọ-amaram nile, Jehova.


Legide n'aka-nrim, hu kwa, n'ihi na ọ dighi onye m'nwere nke nāmatam: Ebe-nb͕alaga alanariwom n'iyì; ọ dighi onye nāju ajuju bayere nkpuru-obim.


Ndi nāchọsi nkpuru-obim ike nēsi-kwa-ram ọnyà; Ndi nāchọ imem ihe ọjọ ekwuwo kwa ihe-ila-n'iyì di iche iche, Ọ bu kwa ihe-aghughọ nile ka ha nātughari n'uche ogologo ubọchi nile.


Were olu-gi tisie nkpu ike, ada Galim! ṅa nti, gi Laisha! Éwù, Anatot nke ewedara n'ala!


Àgākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe? n'ihi na ha egwuworo nkpuru-obim olùlù. Cheta nguzo m'guzoro n'iru Gi ikwu ezi ihe bayere ha, ime ka ọnuma-Gi si n'aru ha laghachi.


N'ihi na anuwom akukọ ọjọ nke ọtutu madu, ujọ dim buruburu. Gosinu, ayi gēgosi kwa ya, ka ha nāsi, bú ndi nile mu na ha di n'udo, ndi nēche nche n'akukum; eleghi anya agāràra ya, ayi ewe nwe ike imegide ya, bọ̀ọ ọ́bọ̀-ayi n'aru ya.


Ka nwoke ahu di kwa ka obodo nile nke Jehova kwaturu, ghara ichèghari: ya nu kwa iti-nkpu n'ututu, na iti-nkpu agha n'etiti-ehihie;


N'ihi na olu dika nke nwanyi ime nēme ka m'nuworo, ihe-nb͕u dika nwanyi nāmu nwa mbu ya, bú olu nke ada Zaion, o nēku ike ike, ọ nāb͕asa ọbu-aka-ya abua, si, Ahuhu dirim nọ̄! n'ihi na nkpuru-obim nāda #mbà n'iru ndi-ob͕u-madu.


N'ihi na ahuwo ndi nēmebi iwu n'etiti ndim: ha nēle anya buruburu, dika ndi-osi-ọnyà si eche anwu; ha esiwo ọnyà, ọ bu madu ka ha nānwude.


Ada nke ndim, ke ákwà-nkpe n'úkwù-gi, turua onwe-gi na ntu: mere onwe-gi oruru-újú dika nke nwa-nwoke enwere nání ya, bú iti-aka-n'obi di ilu nke-uku; n'ihi na ọ bu na mberede ka onye nāpunara madu ihe gābiakwasi ayi.


ubọchi opì-ike na iti-nkpu agha, imegide obodo nile ewusiri ike, na imegide ulo-nkuku nile di elu.


Mb͕e ahu ndi-Farisi gara, we b͕a ìzù otú ha gēme ka Ọ ma n'ọnyà n'okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan