na mb͕e ahu Jehova kwuru okwu site n'aka Aisaia nwa Emoz, si, Je, tọpu ákwà-nkpe n'úkwù-gi, yipu kwa akpukpọ-ukwu-gi n'ukwu-gi. O we me otú a, b͕ara ọtọ nējeghari n'ukwu efu.
Ma ọ buru na ha guzori n'ìzù nzuzo nkem, ha gēmewori ka ndim nuru okwum nile, ha gēmewori kwa ka ha si n'uzọ ọjọ ha na n'ihe ọjọ nke omume nile ha, lata.