Ha we si, Bianu, ka ayi chè èchìchè megide Jeremaia; n'ihi na iwu agaghi-esi n'ebe onye-nchu-àjà nọ la n'iyì, ndum-ọdu agaghi-esi kwa n'ebe onye mara ihe nọ, okwu agaghi-esi kwa n'ebe onye-amuma nọ. Bianu, ka ayi were ire-ayi tib͕ue ya, ma ka ayi ghara iṅa nti n'okwu-ya nile.
Àgākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe? n'ihi na ha egwuworo nkpuru-obim olùlù. Cheta nguzo m'guzoro n'iru Gi ikwu ezi ihe bayere ha, ime ka ọnuma-Gi si n'aru ha laghachi.
Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nānwa onye ezi omume, Onye nāhu akuru na obi, ka m'hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha; n'ihi na Gi ka m'kpugheworo okwu-ikpém.