Jeremaya 18:16 - Bible Nso16 ime ka ala-ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ mb͕e ebighi-ebi; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, o gēfufe kwa isi-ya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi. Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha, nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya. Faic an caibideil |
le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.
N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.
M'gēwere kwa ndi Juda fọduru, bú ndi doworo iru-ha ibà n'ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, agēme kwa ka ha nile gwusia; n'ala Ijipt ka ha gāda; site na mma-agha na site n'oké unwu ka agēme ka ha gwusia: ha gānwu, site n'onye dikarisiri ntà we rue onye dikarisiri uku, site na mma-agha na site n'oké unwu: ha gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta.