Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 17:7 - Bible Nso

7 Onye agọziri agọzi ka nwoke ahu bu nke nātukwasi Jehova obi, onye Jehova bu ihe-ntukwasi-obi-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 “Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya. Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 17:7
16 Iomraidhean Croise  

Ndi nātukwasi Jehova obi Dika ugwu Zaion, nke anādighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya, kama rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ nādigide.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke Chineke nke Jekob bu Onye nēyere ya aka, Nke olile-anya-ya dikwasi Jehova, bú Chineke-ya:


Sutunu onye arọputaworo ọnu, ka ọ ghara iwe iwe, unu we la n'iyì n'uzo, N'ihi na iwe-ya gēre ọku na mb͕e ntà. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ha bu, bú ndi nile nāb͕abà nime ya.


Ndi ahu eruruwo ala, da kwa ada: Ma ayi onwe-ayi ebiliwo, we guzo onwe-ayi ọtọ.


Detunu ire, hu na Jehova di nma: Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke nāb͕abà nime Ya.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke meworo Jehova ka Ọ buru ihe-ntukwasi-obi-ya, Ọ cheghi kwa ndi-nganga iru, ma-ọbu ndi nējehi n'uzọ okwu-ugha.


N'ihi na Gi onwe-gi bu olile-anyam, Onye-nwe-ayi Jehova: Gi bu ntukwasi-obim site na nwata.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātukwasi obi na Gi.


Onye nwere uche n'okwu Chineke gāchọta ezi ihe: Ọzọ, onye nātukwasi Jehova obi, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.


Ọ bu kwa n'ihi nka ka Jehova gēchere, imere unu amara, ọ bu kwa n'ihi nka ka agēbuli Ya, inwe obi-ebere n'aru unu: n'ihi na Chineke nke ikpé ka Jehova bu; ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nile ndi nēchere Ya bu.


idoro ndi Zaion nēru újú, inye ha ihe ọma ike n'isi n'ọnọdu ntu, manu obi-utọ n'ọnọdu iru-újú, ákwà-nb͕okwasi otuto n'ọnọdu mọ nke inyoghi-inyoghi; ka enwe kpọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe-ọkukú nke Jehova, ime ka ọ ma nma.


N'ihi na aghaghm ime ka i wepuga onwe-gi, ọ bughi kwa na mma-agha ka i gāda, kama ndu-gi gāghọrọ gi ihe-nkwata: n'ihi na i b͕abàwo nimem: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Nebukadneza zara, si, Onye agọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego bu, Onye ziteworo mọ-ozi-Ya, we naputa ndi-orù-Ya ndi tukwasiri Ya obi, ọ bu kwa okwu eze ka ha b͕anweworo, we rara aru-ha nye, ka ha we ghara ifè ma-ọbu ikpọ isi ala nye chi ọ bula, ma-ọbughi Chineke-ha.


M'gēme kwa ka otù ndi ewedara n'ala nke nēnweghi kwa ike fọdu n'etiti gi, ha gāb͕abà kwa n'aha Jehova.


ka ayi we buru ihe agēji to ebube-Ya, ayi ndi leworo anya Kraist na mbu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan