Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 17:25 - Bible Nso

25 ndi-eze na ndi-isi, ndi nānọkwasi n'oche-eze Devid, gābata kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a, bú ndi nānọkwasi n'ub͕ọ-ala na n'inyinya, ha onwe-ha, na ndi-isi-ha, ndi Juda, na ndi bi na Jerusalem: obodo a gānọgide kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 mgbe ahụ, ndị eze ndị ga-anọkwasị nʼocheeze Devid ga-edu ndị na-ejere ya ozi na-agafe na-abatakwa site nʼọnụ ụzọ ama a. Ha na ndị na-ejere ha ozi ga-anọkwasị nʼịnyịnya ha, na nʼụgbọ agha ha, mgbe ha sị nʼọnụ ụzọ ama a na-abata, ma na-apụ. Ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem ga-esokwa ha nʼazụ. Aga m emekwa ka ndị mmadụ biri nʼobodo a ruo mgbe ebighị ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 17:25
21 Iomraidhean Croise  

Ma ulo-gi na ala-eze-gi gēkwesi ntukwasi-obi n'iru gi rue mb͕e ebighi-ebi: agēme ka oche-eze-gi buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.


Devid we napu n'aka-ya nnù ndi-inyinya anọ na ọgu ise, na orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje: Devid bipu-kwa-ra nkwonkwo-ukwu inyinya ub͕ọ-ala nile, ma o kwere ka ọgu inyinya ub͕ọ-ala ise fọdu n'etiti ha.


Ubọchi a gāburu unu ihe-ncheta, unu gēme kwa ya ka ọ buru ememe unu nēmere Jehova: n'ọb͕ọ nile unu ka unu ganēme ya ka ọ buru ememe site n'ukpuru ebighi-ebi.


Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.


I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri, Le, M'gaje iwere nṅubiga-manya-ókè mejue ndi nile bi n'ala nka, bú ndi-eze ndi nānọchi Devid n'oche-eze-ya, na ndi-nchu-àjà, na ndi-amuma, na ndi nile bi na Jerusalem.


si, Nuru okwu Jehova, gi eze Juda, onye nānọkwasi n'oche-eze Devid, gi onwe-gi, na ndi-orù-gi, na ndi-gi ndi nābata n'ọnu-uzọ-ama ndia.


Otú a ka Jehova siri, Denu nwoke a n'akwukwọ na ọ bu onye b͕a aka nwa, bú nwoke nke ihe nāgaghi-agara nke-ọma n'ubọchi-ya nile: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nime nkpuru-ya ihe gāgara nke-ọma, nke ganānọkwasi n'oche-eze Devid, nāchi kwa achi ọzọ na Juda.


N'ihi na ọ buru na unu eme ihe a n'ezie, ndi-eze ndi nānọchi Devid n'oche-eze-ya gābata kwa n'ọnu-uzọ-ama nke ulo a, bú ndi nānọkwasi n'ub͕ọ-ala na n'inyinya, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-ya.


nāsi, Biko, latanu, onye ọ bula ya si n'uzọ ọjọ ya na n'ihe ọjọ nke omume nile unu lata, biri-kwa-nu n'elu ala nke Jehova nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-ebi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n'iru:


N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, ka M'gēme ka Ihe-opupú nke ezi omume puere Devid; ọ gēme kwa ihe ekpere n'ikpe na ezi omume n'ala nka.


N'ihi na otú a ka Jehova siri: Agaghi-ebipu n'ulo Devid onye nwe inọkwasi n'oche-eze ulo Israel;


ya bu na agēmebi ọb͕ub͕a-ndum, nke Mu na Devid, bú orùm, b͕ara, ka o we ghara inwe nwa-nwoke nke bu eze n'elu oche-eze-ya; na ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na ndi Livai, bú ndi-nchu-àjà, ndi nējerem ozi, b͕ara.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Menu ka uzọ nile nke unu na omume nile nke unu di nma, M'gēme kwa ka unu biri n'ebe a.


M'gēme kwa ka unu biri n'ebe a, n'ala nka nke M'nyere nna-unu-hà, site na mb͕e ebighi-egi gara aga we rue mb͕e ebighi-ebi di n'iru.


Nání na ọ gaghi-eme ka inyinya bara ya uba, ọ gaghi-eme kwa ndi Israel ka ha laghachi n'Ijipt, ka o we me ka inyinya ba uba: n'ihi na Jehova asiwo unu, Unu alaghachi-kwa-la n'uzọ ahu ọzọ.


kama unu abiaruwo ugwu Zaion, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n'elu-igwe, na ọtutu ndi anāpughi iguta ọnu,


O we si, Nka gābu ikpé eze ahu nke gābu eze-unu: umu-unu ndikom ka ọ gāchiri, doro ha onwe-ya n'ub͕ọ-ala-ya na n'elu inyinya-ya; ha gānab͕a kwa ọsọ n'iru ub͕ọ-ala-ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan