Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 17:24 - Bible Nso

24 O gēru kwa, ọ buru na unu egem nti nke-ọma, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ighara ibubata ibu n'ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a n'ubọchi-izu-ike, kama ya ido ubọchi-izu-ike nsọ, ighara ije ozi ọ bula nime ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ma otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ọ bụrụ na unu ga-elezi anya rubere m isi, hapụ isi nʼọnụ ụzọ ama obodo a bufee maọbụ bubata ibu nʼụbọchị izuike, kama debe ụbọchị izuike nsọ, site na-arụghị ọrụ ọbụla nʼime ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 17:24
11 Iomraidhean Croise  

si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.


Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ.


ma ọ buru na ọ hu usu madu, ndi-inyinya nēje abua abua, usu inyinya-ibu, usu camel, ọ gāṅa nti nāṅasi nti ike nke-uku.


N'ìhi gini ka unu nātù ego inye n'ọnọdu ihe nābughi nri? nà ihe putara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọnọdu ihe nke nādighi-eju afọ? genum nti nke-ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abuba tọ kwa nkpuru-obi-unu utọ.


donu ubọchi-izu-ikem nile nsọ; ha gāghọ kwa ihe-iriba-ama n'etiti Mu na unu, ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Ndi nọ n'ebe di anya gābia kwa, wue n'ulo uku Jehova, unu ewe mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu. Ọ gēme kwa, ọ buru na unu ege olu Jehova, bú Chinek-unu, nti nke-ọma.


O gēru kwa, ọ buru na unu ejisie ike ige nti ihem nile enyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè,


N'ihi na ọ buru na unu ejisie ike idebe ihe nile a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye unu n'iwu, ka unu we me ya; ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, ije ije n'uzọ-Ya nile, na irapara n'aru Ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan