Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 17:22 - Bible Nso

22 unu agaghi-ebupu kwa ibu n'ulo-unu n'ubọchi-izu-ike, ọ bu kwa ozi ọ bula ka unu nāgaghi-eje: ma donu ubọchi-izu-ike nsọ, dika M'nyere nna-unu-hà iwu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Unu esitela nʼụlọ unu buputa ihe ọbụla, unu arụkwala ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike. Doonụ ụbọchị izuike nsọ dịka m nyere nna unu ha nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 17:22
19 Iomraidhean Croise  

Na mb͕e ahu ka m'huru nime Juda ufọdu ndi nāzọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine n'ubọchi-izu-ike, ndi nēbubata kwa obo ọka, nēbo kwa inyinya-ibu; ọzọ kwa, manya-vine, na nkpuru-vine, na fig, na ibu nile ọ bula, ha nēbubata kwa ha nime Jerusalem n'ubọchi-izu-ike: m'we b͕a àmà megide ha n'ubọchi ha nēre ihe-oriri.


Ubọchi isi ka i gālu ọlu-gi, ma n'ubọchi nke-asa i gākwusi n'ọlu: ka ehi-gi na inyinya-ibu-gi we zuru ike, ọzọ, ka nwa nke orù-gi nwayi na ọbìa we turu ndu.


Ọ buru na i me ka ukwu-gi si n'ubọchi-izu-ike chighari, i we ghara ime ihe nātọ gi utọ n'ubọchi nsọm; ọ buru kwa na i kpọ ubọchi-izu-ike ihe-utọ, i kpọ kwa ihe nsọ nke Jehova ihe-nsọpuru; i we sọpuru ya, ghara ime ihe bu uzọ-gi nile, ghara ichọputa ihe nātọ gi utọ ma-ọbu ikwu okwu nke aka gi:


O gēru kwa, ọ buru na unu egem nti nke-ọma, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ighara ibubata ibu n'ọnu-uzọ-ama nile nke obodo a n'ubọchi-izu-ike, kama ya ido ubọchi-izu-ike nsọ, ighara ije ozi ọ bula nime ya;


Ọzọ, ubọchi-izu-ikem nile ka M'nye-kwa-ra ha, ighọ ihe-iriba-ama n'etiti Mu na ha, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova, Nke nēdo ha nsọ.


Ihe nsọm nile ka i ledaworo anya, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka i meworo ka ha ghara idi nsọ.


Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Ubọchi isi ka agēje ozi: ma n'ubọchi nke-asa, ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādi, bú nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ubọchi-izu-ike nke Jehova nwere ka ọ bu n'ebe-obibi-unu nile.


Unu adila ka nna-unu-hà, ndi ndi-amuma mbu kpọrọ òkù, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Biko, sinu n'uzọ ọjọ nile unu, na n'omume ọjọ nile unu, lata: ma ha anughi, ha aṅaghkwam nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ha we laghachi, dozie uda utọ di ichi iche na manu-otite. N'ubọchi-izu-ike ha we nọdu nwayọ dika ihe enyere n'iwu si kwu.


O we si ha, Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike.


Emere ka m'nọ nime Mọ Nsọ n'ubọchi Onye-nwe-ayi, m'we nu otù oké olu n'azum, dika nke opì,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan