Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 17:20 - Bible Nso

20 si ha, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na Juda nile na ndi nile bi na Jerusalem, bú ndi nābata n'ọnu-uzọ-ama ndia:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Gwa ha sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda na ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jerusalem, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a apụ, na-abatakwa.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 17:20
13 Iomraidhean Croise  

Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n'ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu.


Otú a ka Jehova sirim: Je, guzo n'ọnu-uzọ-ama nke umu ndim, nke ndi-eze Juda nēsi abata, nke ha nēsi apu kwa, guzo kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem;


si, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na ndi bi na Jerusalem; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.


N'ihi na ha arapuwom, we ghara imata ebe a, we surere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ nime ya, bú ndi ha nāmaghi, ha onwe-ha na ndi bu nna-ha na ndi-eze Juda; ha emejuwo kwa ebe a n'ọbara ndi nēmeghi ihe ọjọ;


Ma okwu bayere ulo eze Juda, nurunu okwu Jehova:


si, Nuru okwu Jehova, gi eze Juda, onye nānọkwasi n'oche-eze Devid, gi onwe-gi, na ndi-orù-gi, na ndi-gi ndi nābata n'ọnu-uzọ-ama ndia.


I gāgwa kwa ha okwum nile, ma ha gānu, ma ha gāghara: n'ihi na ndi nānupu isi nke-uku ka ha bu.


Nwa nke madu, Onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel: i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam.


Nurunu nka, unu ndi-nchu-àjà, ṅa-kwa-nu nti, unu ulo Israel, unu ulo eze, ge-kwa-nu nti, n'ihi na unu ka ikpé a diri; n'ihi na ib͕udu ka unu buworo na Mizpa, unu abuwo kwa ub͕u ab͕asara n'elu Teboa.


Nurunu okwu a, unu nne-ehi nke Beshan, ndi nọ n'ugwu Sameria, ndi nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, ndi nāzọpia umu-ob͕eye, ndi nāsi ndi-nwe-ha, Wetanu, ka ayi ṅua.


M'we si, Biko, nurunu, unu ndi-isi Jekob, na unu ndi-ikpe ulo Israel: ọ̀ bughi ihe diri unu, bú imara ikpé?


Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan