Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 17:18 - Bible Nso

18 Ka ihere me ndi nēsob͕um, ma ka ihere ghara ime mu onwem; ka ndi ahu tua ujọ, ma ka mu onwem ghara itu ujọ: me ka ubọchi ihe ọjọ biakwasi ha, were kwa okpukpu ntipia abua tipia ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m. Ekwekwala ka ihere mee m. Mee ka ha tụọ ụjọ, ma chebe m site nʼihe egwu. Mee ka ụbọchị mbibi bịakwasị ha, werekwa okpukpu ihe mbibi abụọ tipịa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 17:18
21 Iomraidhean Croise  

O nētipúm ntipú n'elu ntipú-ibe-ya; Ọ nāb͕akwasim dika dike.


Ka ihere me ha, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, bú ndi nāchọsi nkpuru-obim ike: Ka ha b͕aghachi azu nwe iru-ihere, bú ndi nēchè ihe ọjọ ha gēmem.


Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi; Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya: Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya.


Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù, Bú ndi nāchọ nkpuru-obim ikpochapu ya: Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.


Ka ihere me ha, ka ha nwe kwa iru-ihere, Bú ndi nāchọ nkpuru-obim: Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere, Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.


Nime Gi, Jehova, ka m'b͕abàworo: Ekwela ka ihere mem rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma gi onwe-gi, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, bilie, gwa ha ihe nile Mu onwem nēnye gi n'iwu: atula ujọ ha, ka M'we ghara ime ka i tu ujọ n'iru ha.


Ma, Gi Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye nēkpe ikpe n'ezi omume, Onye nānwa akuru na obi, kwe ka m'hu ọ́bọ̀-Gi nke I gābọ̀ ha: n'ihi na Gi ka m'kpugheworo okwu-ikpem.


Ma Gi onwe-gi maram, Jehova; I nāhum, nwa kwa nkpuru-obim n'ebe I nọ: dọkpupu ha dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u, do ha nsọ nye ubọchi ob͕ub͕u.


I gāgwa kwa ha okwu a, si, Ka anya-miri si n'anyam erùda abali na ehihie, ka ha ghara kwa iguzo du; n'ihi na nb͕aji ukwu na aka di uku ka ejiworo b͕aji ada ndim nāmaghi nwoke, ọ bu ntiputa-ọnyá nke jọrọ njọ nke-uku.


Ma M'gēburu uzọ kwughachi ajọ omume-ha na nmehie-ha okpukpu abua; n'ihi na ha emewo alam ka ọ ghara idi nsọ n'ozu nke nile ha nke nāsọ oyi, ọ bu kwa ihe-árú nile ha ka ha ji kpojue ihe-nketam.


olile-anya Israel, ka Jehova bu, ihere gēme ndi nile nārapu Gi: ndi nēsi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha, n'ala ka agēde ha, n'ihi na ha arapuwo isi-iyi nke miri nēnye ndu, bú Jehova.


Ma mu onwem, anukpọghm ipu n'iso Gi n'izù aturu; ọzọ, ubọchi nādighi ngwọta, achọsighm ya ike; Gi onwe-gi mara: ihe si n'eb͕ub͕ere-ọnum puta, na ncherita-iru Gi ka ọ diworo.


Otú a ka Jehova sirim: Je, guzo n'ọnu-uzọ-ama nke umu ndim, nke ndi-eze Juda nēsi abata, nke ha nēsi apu kwa, guzo kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem;


Ma Jehova nọyerem dika dike nke nēme ka ama jijiji: n'ihi nka ndi nēsob͕um gāsu ngọngọ, ha agaghi-enwe kwa ike: ihere gēme ha nke-uku, n'ihi na ha enweghi uche, agaghi-echezọ ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi nke etiyere ha.


Jehova, gọzie àkù-ya, Ka ọlu aka-ya abua tọ kwa Gi utọ: Mapue úkwù ndi nēbili imegide ya, Na nke ndi nākpọ ya asì, ka ha ghara ibili ọzọ.


Nyeghachinu ya ọbuná dika ya onye-ya nyeghachiri madu, nye-kwa-nu ya okpukpu abua dika ọlu-ya nile di: nime iko ahu ọ kwara akwa, kwaranu ya okpukpu abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan