Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 15:5 - Bible Nso

5 N'ihi na ònye gēnwe ọmiko n'aru gi, Jerusalem? ma-ọbu ònye gēgosi gi ebere o nwere n'aru gi? ma-ọbu ònye gēwezuga onwe-ya iju ajuju bayere udo-gi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 “Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem? Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị? Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 15:5
15 Iomraidhean Croise  

Merenum amara, merenum amara, unu onwe-unu, bú ndi-eyìm; N'ihi na aka Chineke emetuwom n'aru.


Ita-uta etiwawo nkpuru-obim; anamariasi kwa ọria ike: M'we le anya onye gēgosim ebere o ji n'arum, ma ọ dighi onye ọ bula; M'le-kwa-ra anya ndi-nkasi-obi, ma achọtaghm onye ọ bula.


Moses we pua izute nna nwunye-ya, we kpọ isi ala, sutu kwa ya ọnu; ha we jurita onwe-ha ma ha nọ n'udo; ha we ba n'ulo-ikwū.


Ihe abua ndia adakwasiwo gi; ebere o nwere n'aru gi? nbibi na ntikpọ na oké unwu na mma-agha: M'gēsi aṅa kasie gi obi?


M'gātupia kwa ha, otù onye n'elu ibe-ya, ọbuná ndi bu nna na umu-ha n'otù; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: M'gaghi-enwe ọmiko, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa obi-ebere, ka M'we ghara ibibi ha.


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Abala n'ulo nke ikwa-ozu, eje-kwa-la iti aka n'obi, egosi-kwa-la ha ebere i nwere n'aru ha: n'ihi na ewepuwom udom n'ebe ndi nka nọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ebere na obi-ebere nile.


Ma emesia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-orù-ya, na ndim, bú ndi puru n'ajọ ọria ahu nke nēfe efe, pu kwa na mma-agha, na n'oké unwu, fọduru n'obodo a, nye ha n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha: ọ gēji kwa ọnu mma-agha tib͕u ha; ọ gaghi-emere ha ebere, ọ gaghi-enwe kwa ọmiko, ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere.


Zaion ab͕asawo aka-ya abua; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere; Jehova enyewo iwu bayere Jekob, na ndi nọ ya buruburu gābu ndi nākpab͕u ya: Jerusalem aghọwo ihe-isọ-nsọ n'etiti ha.


O gēru kwa, na ndi nile ndi nāhu gi gāb͕anari gi, si, Ebibiwo Nineve: ònye gēgosi ya ebere o ji n'aru ya? Òle ebe M'gāchọputara gi ndi-nkasi-obi?


Ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, biarue ulo nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai, bú ulo Maika, jua ya ajuju bayere udo-ya.


ha gāju kwa gi ajuju bayere udo-gi, we nye gi ob͕e achicha abua; i gānara kwa ha n'aka-ha.


Devid we zitu ihe nile o bu rapu n'aka onye nēdebe ihe, o we b͕abà n'usoro-agha, bia, jua umu-nne-ya ajuju bayere udo-ha.


Devid we ziga umu-okorọbia iri, Devid we si umu-okorọbia ahu, Rigoruenu Kamel, bakuru Nebal, jua ya ajuju bayere udo-ya n'aham,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan