Jeremaya 15:4 - Bible Nso4 M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n'ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n'ihi ihe o mere na Jerusalem. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a4 Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem. Faic an caibideil |
N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Unu onwe-unu egeghm nti, ikpọsa, onye o bula ọ gwa nwa-nne-ya, onye ọ bula o gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya: le, M'nākpọsara unu si na unu nwere onwe-unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ibà na mma-agha, na ibà n'ajọ ọria nēfe efe, na ibà n'oké unwu; M'gēwere kwa unu nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.