Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 15:21 - Bible Nso

21 M'gānaputa kwa gi n'aka ndi ọjọ, b͕aputa gi n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 “Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ. Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 15:21
24 Iomraidhean Croise  

Mọ-ozi ahu Nke nāb͕aputam n'aka ihe ọjọ nile, Ya gọzie umu-okoro ndia; ka akpọ kwa n'isi ha aha nkem, na aha nnam-hà, bú Abraham na Aisak; ka ha ba kwa uba rue ọtutu madu n'etiti uwa.


Mb͕e ndi nēme ihe ọjọ biarurum nso iri anu-arum, Bú ndi nākpab͕um na ndi-irom, ha onwe-ha suru ngọngọ, da n'ala.


Jehova nēye-kwa-ra ha aka, nēme ka ha b͕apu: Ọ nēme ka ha si n'aka ndi nēmebi iwu b͕apu, Ọ nāzọputa kwa ha, N'ihi na ha ab͕abàwo nime Ya.


Unu ndi nāhu Jehova n'anya, kpọnu ihe ọjọ asì: Ọ nēdebe nkpuru-obi ndi-ebere-Ya; Ọ nānaputa ha n'aka ndi nēmebi iwu.


N'ihi na onye nēme ka madu ma jijiji nwere ọgwugwu, onye nākwa emò agwusiwo kwa, ebipuwo kwa ndi nile nāmuru ajọ ihe anya:


Ma ìgwè ndi ala ọzọ nēmegide gi gādi ka ájá di ntà, ìgwè ndi nēme ka madu ma jijiji gādi kwa ka ib͕ob͕o-ọka nke nāgabiga agabiga: ọ gādi kwa n'otù ntabi-anya na mberede.


M'gēme kwa ka ndi nēme gi ihe-ike rie anu-aru onwe-ha: ha gāṅubiga kwa ọbara onwe-ha ókè, dika ọ bu manya-vine ọhu: anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi, na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.


Ọ dighi ihe-agha ọ bula akpuworo imegide gi gāga nke-ọma: ọzọ, ire ọ bula nke gēbili imegide gi n'ikpé ka i gāma ikpe. Nka bu ihe-nketa nke ndi-orù Jehova, ezi omume-ha nēsite nam: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


I gāṅu kwa miri-ara nke mba di iche iche, ọ bu kwa ara ndi-eze ka i gāmi: i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.


Okwu Jehova we ruem nti, si


Bùkuenu Jehova abù, tonu Jehova: n'ihi na Ọ naputawo nkpuru-obi nke ob͕eye n'aka ndi nēme ihe ọjọ.


Ma otú ọ di, aka Ahaikam nwa Shefan di n'akuku Jeremaia, ka ha we ghara inye ya n'aka ndi Israel ime ka ọ nwua.


N'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, me ka ọ pua n'aka onye dikariri ya ike nwere onwe-ya.


Jeremaia we nọgide n'ogige ulo-nche rue ubọchi ewere Jerusalem. O rue, mb͕e ewere Jerusalem,


Nebukadreza, bú eze Babilon, we nye Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, iwu bayere Jeremaia, si,


Were ya, ka anya-gi abua di n'aru ya, eme-kwa-la ya ihe ọjọ ọ bula; kama dika ọ gēsi gwa gi, me ya otú a.


Onye-nb͕aputa-ha di ike; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: Ọ gēkpezu ọnu-ha, ka O we me ka uwa doro aru ala, me kwa ka ndi bi na Babilon me nkpatu.


Asi na ọ di uzọ ọ bula Chineke ahu Onye ayi onwe-ayi nēfè puru inaputa ayi, ọ bu n'oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu na n'aka-gi, eze, ka Ọ gānaputa ayi.


Ọ zara, si, Le, mu onwem nāhu ndikom anọ atọpuru ab͕u, nējeghari n'etiti ọku ahu, ma emerughi ha ahu; onye ahu nke mere ha anọ yiri nwa nke ndi bu chi n'ile ya anya.


Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu.


Ma Chineke nke udo gāzọpia Setan n'okpuru ukwu-unu ọsọsọ. Amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere unu.


Onye dọputara ayi n'oké ọnwu di otú a, Ọ gādọputa kwa ayi: Onye ayi leworo anya Ya na Ọ ganādọputa kwa ayi ọzọ;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan