Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 15:14 - Bible Nso

14 M'gēme kwa ka ha soro ndi-iro-gi gabiga n'ala i nāmagh: n'ihi na amuyewo ọku n'iwem, n'aru unu ka ọ gēre.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị. Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị. Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ nke ga-eregbu gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 15:14
18 Iomraidhean Croise  

I gēme ha ka ha di ka ite-ọku uku di ọku na mb͕e I ji me ka ha hu iru-Gi: Jehova gēloda ha n'iwe-Ya, Ọku gēripia kwa ha.


O we wukwasi ya ọnuma nke iwe-Ya, na ike nke agha; nke ahu we suye ya ọku buruburu, ma ọ maghi; o we re ya ọku, ma ọ dighi-atughari obi-ya na ya.


Ọ buru na apuam je n'ọhia, le, ndi ejiworo mma-agha b͕u! ma ọ buru na abàm n'obodo a, le, ndi nāria ọria site n'oké unwu! n'ihi na ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà, ha akpaghariwo n'ala, ma ha amaghi ihe.


M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n'ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n'ihi ihe o mere na Jerusalem.


M'gātupu kwa unu n'elu ala nka tukwasi unu n'ala ahu nke unu nāmaghi, ma ọ bu unu onwe-unu ma -ọbu nna-unu-hà; unu gēfè kwa chi ọzọ di iche iche n'ebe ahu ehihie na abali; n'ihi na M'gaghi-emere unu amara.


I gārapu kwa, ọbuná site n'onwe-gi, ihe-nketa-gi nke M'nyere gi; M'gēme kwa ka i fè ndi-iro-gi n'ala ahu nke i nāmagh: n'ihi na ọku ka unu muyeworo n'iwem, rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ gēre.


Bìenu onwe-unu úgwù nye Jehova, bìenu onwe-unu úgwù n'obi, unu ndikom Juda na ndi bi na Jerusalem: ka ọnuma m we ghara ipu dika ọku, we re nke ọ nādighi onye nēmenyu, site n'ihe ọjọ nke omume nile unu.


Eze Babilon we tib͕ue ha, me ka ha nwua na Ribla, n'ala Hemat. Ewe me ka Juda si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.


M'gēme kwa ka unu je biri n'ala ọzọ n'ofè Damaskọs, ka Jehova, Onye aha-Ya bu Chineke nke usu nile nke ndi-agha, siri.


Jehova gēme ka etib͕ue gi n'iru ndi-iro-gi: n'otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n'uzọ asa ka i gāb͕alaga n'iru ha: i gāghọ-kwa-ra ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.


Jehova gēme ka gi na eze-gi, nke i gēguzo ka ọ buru eze-gi, jerue otù mba nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ n'ebe ahu, bú osisi na nkume.


Jehova gēme kwa ka i b͕asa n'etiti ndi nile, site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu uwa nke-ọzọ; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ òfùfè n'ebe ahu, nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà, bú osisi na nkume.


mb͕e ha nāhu kwa na ala-ya nile bu brimstone, na nnú, na orire-ọku, na adighi-agha ya nkpuru, na ọ dighi-eme kwa ka ihe pue, na ọ dighi kwa ihe-ọkukú ọ bula nētolite nime ya, dika nkwatu Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, nke Jehova kwaturu n'iwe-Ya na n'ọnuma-Ya:


N'ihi na amuyewo ọku n'iwem, Ọ nēre kwa rue ala-mọ nke dichasi ala, Ọ nēripia kwa uwa na ihe-ọmume-ya, Nēme kwa ka ntọ-ala nile nke ugwu nile nwuru ọku.


n'ihi na Chineke-ayi bu ọku nērechapu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan