Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 15:10 - Bible Nso

10 Ahuhu dirim, nnem, na i muwom onye-ọ̀gù na onye-esem-okwu n'ebe uwa nile di! ebinyeghm ego n'uma; madu ebinyeghkwam ego n'uma; ma onye ọ bula nime ha nākọcham.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m, onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu. O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego, ma mmadụ niile na-akọcha m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 15:10
32 Iomraidhean Croise  

Ehab we si Elaija, Ì chọtawom, onye-irom? Ọ si, Achọtawom i: n'ihi na i rewo onwe-gi ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n'aka-ya, bú Maikaia nwa Imla: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n'ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a.


Ndi ahu gākọcha, ma Gi onwe-gi nāgọzi: Ha ebiliwo, ihere we me ha, ma orù-Gi gāṅuri.


Ọ nyeghi ego-ya inara uma, Ọ naraghi kwa ihe-iri-ngo megide onye nēmeghi ihe ọjọ. Onye nēme ihe ndia, agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi.


Ha di ọtutu kari agiri-isi nke isim, bú ndi nākpọm asì n'efu: Ha nwere ume, bú ndi nēkpochapum, ebe ha bu ndi-irom n'uzọ okwu-ugha: Mb͕e ahu ka m'nēnyeghachi ihe m'nānapugh n'ike.


Ọ buru na i binye onye ọ bula n'etiti ndim ego, bú onye ewedara n'ala, onye gi na ya nọ, aburula ya dika onye nānara ọmuru-nwa; unu atukwasi-kwa-la ya uma.


Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya, Otú a nkọcha adighi-abia n'efu.


M'gēme kwa gi ka i ghọrọ ndi nka mb͕idi ọla ewusiri ike; ha gēbuso kwa gi agha, ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n'ihi na gi ka M'nọyere izọputa gi na inaputa gi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Anarala ya uma ma-ọbu ọmuru-nwa; ma tua egwu Chineke-gi: ka nwa-nne-gi we biyere gi.


Enyela ya ego-gi n'uma, enye-kwa-la ya ihe-oriri-gi n'ọmuru-nwa.


N'ìhi gini ka I nēme ka m'hu ajọ ihe? n'ìhi gini ka I nēlegide nmeb͕u? ma ipunara-madu-ihe ma ihe-ike di n'irum: ilu-ọ̀gù we di, esem-okwu nēbuli kwa onwe-ya.


Mb͕e ahu ka ha gārara unu nye na nkpab͕u, ha gēb͕u kwa unu: mba nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham.


ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu;


Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide;


Ngọzi nādiri unu, mb͕e ọ bula madu gākpọ unu asì, mb͕e ọ bula ha gēkewapu kwa unu, ta kwa unu uta, tufu kwa aha-unu dika ajọ ihe, n'ihi Nwa nke madu.


Ma ọ di ayi nma inu n'ọnu-gi ihe i tukwasiri uche-gi na ha: n'ihi na ihe bayere irọ-òtù a, ayi mazuru na anēkwugide ya ebe nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan